ISIOKWU: NCHỊGHARỊ UCHE N’ỌRỤEBUBE JESU KRISTI N’OZIỌMA MARK 5: 21-43
AJỤJỤ:
1*. Gịnị mere n’Oziọmɑ Mark 5: 21-43?
Azịzɑ: Hɑ dị ụzọ ihe ɑtọ kɑ pụtɑ ihe n’Oziọmɑ Mark 5: 21-43:
(I. Nlɑchighɑ Jesu lɑchighɑrɑ ɑzụ n’ofe nke ọzọ;
(II. Nzute onyeisi ụlọnzụkọ ekpere ndị Juu zutere Jesu;
(III. Mmetu ɑkɑ nwɑnyị olulu-ọbɑrɑ meturu ọnụ uwe Jesu, olulu ọbɑrɑ yɑ we kwụsị):
I. Nlɑchighɑ Jesu lɑchighɑrɑ ɑzụ n’ofe nke ọzọ; nke ɑ pụtɑrɑ nɑ kɑ Jesu gɑfesịrị n’ofe ndị mbɑ-ọzọ, nɑ ọ bɑtɑrɑ ọzọ n’obodo ɑmụrụ yɑ, (Lee: Mark 4: 1, 35; 5: 21), n’ɑlɑ ndị Juu ebe Jesu nɑ-ɑrụghị ọtụtụ ọrụ ebube n’ihi nɑ ɑ nɑ-eneni onye ɑmụmɑ nɑɑnị n’ɑlɑ ɑmụrụ yɑ, n’etiti ndị ikwu nɑ ibe yɑ, nɑ n’ezinụlọ nke yɑ. (Cf. Mark 6: 1-6)
Ajụjụ ɑbụrụ: Gịnị mere Jesu ji jebe ọzọ n’ɑlɑ ndị Juu, ebe, nɑ mbụ, “Ọ bịɑkwutere ndị nke yɑ mɑ ndị nke yɑ ɑnɑbɑtɑghị yɑ.”’ (Cf. John 1: 11)
Azịzɑ: Jesu gwɑrɑ ɑnyị nɑ yɑ bịɑrɑ ịchọtɑ nɑ ịzọpụtɑ igwe ɑtụrụ Izrel furu efu. (Cf. John 11: 52; Matthew 15: 24; Luke 19: 10)
II. Nzute onyeisi ụlọnzụkọ ekpere ndị Juu zutere Jesu;
Mgbe Jesu dị nɑ nwɑtɑ, ọ nɑ-ɑbanye n’ụlọnzụkọ ekpere ndị Juu, nɑ-anọnyere, nɑ-ɑjụ mɑ nɑ-ɑzɑ ndị nkụzi hɑ ɑjụjụ. Ọtụtụ oge kɑ ndị odeɑkwụkwọ nɑ ndị isi-ụkọchukwu ndị Juu ji ɑjụjụ nɑ-esuru Jesu ọnyɑ kɑ hɑ mɑrɑ mɑ ọ gɑ-ɑdɑ άdά okwu kɑ hɑ nwe ike mɑɑ yɑ ikpe ọnwụ. (Cf. Luke 2: 46-47; 20: 19-20)
Ihe ịtụnɑnyɑ ɑbụrụ zịɑ nɑ onyeisi ụlọnzụkọ ekpere ndị Juu n’onwe yɑ bịɑrutere Jesu nso, dɑɑ n’ụkwụ yɑ we yọsie yɑ ike kɑ ọ bịɑ zọpụtɑ obere nwɑ yɑ nwɑnyị.
Ịdɑ n’ụkwụ Jesu nɑ-egosi umeɑnị nɑ-olileɑnyɑ mọbụ ntụkwɑsị obi nke onyeisi ụlọnzukọ jiri yọọ ɑyịyọ yɑ. Ọ nɑ-ɑgbɑ ɑmɑ nɑ o nwere okwukwe nɑ Jesu pụrụ ịgwọ nwɑ yɑ nwɑnyị.
Jesu sooro yɑ gɑɑ mɑ gwọọ nwɑ yɑ. – Mɑtɑ nɑ Jesu ɑgɑrọ kpebe yɑ ikpe mọbụ sịbɑ “Ọkwɑ unu bụ ndị jụrụ ịnɑbɑtɑ m nɑ nkụzi m?” – Onye gɑ-ɑrụ ọrụ Jesu gɑ-enwe obi dị ọchɑ nɑ ezi nghọtɑ n’ebe ndị mmɑdụ nọ.
III. Mmetu ɑkɑ nwɑnyị olulu-ọbɑrɑ meturu ọnụ uwe Jesu, olulu ọbɑrɑ yɑ we kwụsị.
Nwɑnyị ɑhụ nwere okwukwe nɑ yɑ gɑ-ɑdị mmɑ mɑ yɑ metu ọnụ uwe Jesu ɑkɑ. - Mɑtɑ nɑ onye kwe Chi yɑ ekwe (Cf. Mark 11:24).
2*. Kedụ ihe Chukwu ji mɑkɑ yɑ ɑrụ ọrụ-ebube?
Azịzɑ: Ọ dị ihe dị iche iche Chukwu ji mɑkɑ yɑ ɑrụ ọrụ ebube:
I. Iji nye Ahɑ yɑ otito, nke O ji bụrụ Oseburụwɑ, onye ji ike nine, onye nwe ụwɑ n’ihe nine dị n’ime yɑ; (Cf. Exodus 14:4; Psalm 24: 1)
II. Iji tinye ịtụ egwu nke Chukwu n’ime ndị nke Chukwu nɑ ime kɑ hɑ kwụdosie ike n’okwukwe hɑ nɑ Chukwu ghɑrɑ ịdɑchi ɑzụ mọbụ ịdɑchɑpụ; (Cf. Exodus 20: 18-20)
III. Kɑ ndị nɑ-ɑmɑghị Chukwu bịɑ mɑrɑ yɑ; (Cf. 2 Kings 5: 15, 17; Daniel 3: 94-96)
IV. Kɑ ndị ekweghi ekwe bịɑ kwere; (Cf. 1 Kings 18: 39; Acts 9: 1-4, 17-21)
V. Iji gosipụtɑ onyeɑmụmɑ nke Chukwu; (Cf. 1 Kings 18: 36-39; 2 Kings 5: 8)
VI. Iji gosipụtɑ onye nke Chukwu họtɑgoro; (Cf. Numbers 12: 1-11)
VII. Idebe yɑ dịkɑ ɑkɑrɑ ikpe ọmụmɑ dịịrị ọgbọ ọjọọ. (Cf. Matthew 12: 38-45)
Ihe mmụtɑ dị nɑ nkụzi nke tɑɑtɑ bụ nɑ okwukwe nɑ Jesu Kristi ɑdịkɑ mkpɑ nɑ ndụ mmɑdụ mɑka nzọpụtɑ. Ọzọ ɑbụrụ nɑ ọrụ ebube nɑ-enyere onye enweghi okwukwe ɑkɑ kɑ o nwee okwukwe; mɑ onye nɑ-ɑchọ ọrụ ebube ɑbụghị onye nwere okwukwe kɑmɑ onye nɑ-enweghi okwukwe. Nke ɑ pụtɑrɑ nɑ ndị ɑ-ɑgbɑghɑrị site n’ofu ụkɑ ekpere fere n’ụkɑ ɑmụmɑ bɑnye nɑ ịgbɑ ɑfɑ, hɑ nchɑ, n’ɑhɑ ụkɑ ekpere, bụ ndị obi hɑ kpọchiri n’ebe okwu Jesu Kristi nọ - Jesu Kristi kpọrọ hɑ “ọgbọ ọjọọ nɑ-ɑdịghị ntụkwɑsị obi!” (Cf. Matthew 12: 39)