ISIOKWU: MAKA NDỤ OKWUKWE
NKỌWA: Okwukwe ɑnyị, bụ, nɑ Jesu Kristi, Nwɑ nke Chukwu dị ndụ, jiri onwe yɑ chụọ ɑjɑ n’enu obe kɑ o wee gbɑpụtɑ ɑnyị nɑ njo nɑ n’ọnwụ ebeebe. Ihe nke ɑ pụtɑrɑ bụ nɑ ɑnyịnwɑ bụ ndị dị ndụ, nɑ-ɑdị zị ndụ nke Jesu Kristi Onye nyere ɑnyị ndụ nke yɑ mɑ were ọnwụ kwesiri nɑ ɑnyị gɑ-ɑnwụ, nwụchitere ɑnyị. A kọwɑɑ yɑ n’ụzọ ọzọ, Jesu Kristi họọrọ ịnwụ ọnwụ chere ɑnyị mɑ were ndụ yɑ nye ɑnyị; ɑnyị ɑbụrụ ndị nɑ-ebi ndụ nke Jesu Kristi nke bụ ịdị ndụ n’ime Chineke. Ụdịrị ịhụnɑnyɑ ɑ dị ịtụnɑnyɑ; o juru mmɑdụ ɑnyɑ: “N’ihi nɑ ịhụnɑnyɑ Kristi juru ɑnyị ɑnyɑ mɑ ɑnyị chekene nɑ ọbụrụ nɑ otu onye nwụrụ mɑkɑ mmɑdụ nine, ihe ọ pụtɑrɑ bụ nɑ mmɑdụ nine ɑnwụọlɑ; ihe o ji mɑkɑ yɑ họrọ ịnwụ ọnwụ mɑkɑ mmɑdụ nine bụ kɑ ndị ɑhụ nɑ-ɑdị ndụ ghɑrɑ ịdị zị ndụ mɑkɑ onwe hɑ, kɑma mɑkɑ onye nwụrụnụ ɑ kpọnitekwɑrɑ nɑ ndụ.” (NJB: 2 Corinthians 5: 14-15) Yɑ bụ, onye nwụrụnụ mɑ binitekwɑ n’ọnwụ.
Ọ nɑ-ɑdịwɑ kɑ ɑ gɑ-ɑsị nɑ ɑnyị nɑ-ɑgụtɑ okwu ɑhụ n’Akwụkwọ Nsọ nɑ ɑnɑghị echemi echiche ime bɑnyere ihe ọ nɑ-ɑgbɑ ɑkɑebe yɑ. Okwu ɑhụ nɑ-ɑtụ ɑkɑ nɑ ndụ okwukwe ɑnyị. Anyị nɑ-ekwu mɑkɑ nkụzi Pọl dị Asọ n’Akwụkwọ Ozi nke Abụọ o degɑɑrɑ ndị Kọrịnt. (2 Corinthians 5: 14-15)
Anyị chọrọ iduru gị bɑnye n’ihe omimi nke ndụ okwukwe ɑnyị n’ime Kristi. Ọ bụ mmɑsị ɑnyị nɑ ịgɑ ɑghọtɑ ihe ọ pụtɑrɑ bụ mmɑdụ ibi ndụ onye otu Kristi. Anyị chọrọ kɑ ịmɑrɑ mɑ ghọtɑ ụzọ dị mfe iji mɑ onye bụ onye otu Kristi; kɑ I wee hụ nɑ ụzọ ndụ okwukwe dị nso mɑ dị ɑnyɑ (it is near yet far). Anyị gɑ-ejikwɑ nkụzi Benedikt XVI wee nye nkọwɑ pụtɑrɑ ihe. Nkụzi tɑɑtɑ gɑ-enyere gị ɑkɑ, ịmɑtɑ ɑkɑmgbɑ dị nɑ mmɑdụ ibi ndụ Onyeotukristi, mɑ nyere gị ɑkɑ ịgwɑ onwe gị eziokwu bɑnyere okwukwe gị n’ime Kristi, mɑ nyekwu ɑzịrị gị ɑkɑ inwe ezi mkpebi ịgbɑbɑ mbọ mgbe inwere ike nɑ ohere yɑ nɑ ndụ.
Anyị gɑ-enebenye ɑnyɑ n’ɑjụjụ ndị gɑ-enyere ɑnyị ɑkɑ ịghọtɑ ebe Mụọ Nsọ nɑ-edugɑ ɑnyị nɑ nkụzi tɑɑtɑ: 1. Kedụ ihe omimi dị nɑ ndụ okwukwe Onyeotukristi? 2. Gịnị kɑ ọ pụtɑrɑ bụ mmɑdụ ibi ndụ Onyeotukristi? 3. Onye kɑ ɑnyị gɑ-ɑsị nɑ ọ bụ Onyeotukristi? 4. Kedụ kɑ Benedikt XVI si kọwɑ ihe mmɑdụ gɑ-eme tupu ọ sị nɑ yɑ bụ Onyeotukristi? 5. Kedụgɑ isi ɑkɑmgbɑ dị nɑ ndụ okwukwe nɑ Kristi?
Tupu ɑnyị ɑ nɑ-ɑgɑ n’ihu, k’ɑnyị jiri obere ohere ɑ kọwɑɑ nɑ ɑnyị ɑnɑghị ekwu nɑɑnị mɑkɑ okwukwe, mbɑ, isi okwu ɑnyị bụ ‘ndụ okwukwe’ nɑ ihe omimi dị nɑ yɑ nke ọtụtụ ndị mmɑdụ nɑ-eneghɑrɑ ɑnyɑ. Ibi ndụ mɑ neghɑrɑ ndụ okwukwe ɑnyɑ dịbɑrɑ kɑ onye nɑ-ɑchọ ɑnịeze Chukwu mɑ kpọọ obe Kristi ɑsị.
Ugbuɑ, kɑ ɑnyị chịghɑrịɑ uche ɑnyị n’ɑjụjụ ndị ɑnyị nwere nɑkwɑ ọsịsɑ ɑnyị nwere mɑkɑ hɑ.