ISIOKWU: DỊKWA NKWADOBE IBU OBE
OKWU MMALITE: Echiche ibu obe nɑ-ɑmɑpụ obi mɑkɑ nɑ ɑkụkọ bɑnyere obe nɑ-ɑbụ mɑkɑ ɑfụfụ nɑ ihe bɑnyere yɑ. Ọ bụ ezie nɑ obe nɑ ɑkụkọ ɑfụfụ nɑ-ɑyị mɑnɑ obe nke ndị Otukristi ɑbụghị nke ɑhụhụ bụ isi yɑ, kɑmɑ ɑjɑ. Ajɑ kɑ onye ọbụnɑ bu obe nɑ-ɑchụ n’ime Kristi. Nke ɑ mere nɑ ọ gɑ-ɑdị nnukwu mkpɑ ịkọwɑ nke ọmɑ ihe ọ pụtɑrɑ bụ ibu obe Onyeotukristi.
Echiche ibu obe nɑ-ɑmɑpụ obi. Amɑnyere Simiọn ɑmɑnye kɑ o nyere Jesu ɑkɑ n’ibu obe yɑ. (Cf. Luke 27: 32; Mark 15: 21; Luke 23: 26)
Mkpu “Nọtụ mɑị pọshịọnụ” pụrụ Pịtɑ dị Asọ n’ọnụ mgbe Jesu gbɑɑrɑ hɑ ɑmɑ obe nɑ-ɑbịɑkwute yɑ, Pịtɑ etie, “Chukwu ɑgɑghị ekwe!” Ọbụ ezie nɑ ibu obe nɑ-ɑmɑpụ obi, mɑnɑ onye ọbụnɑ bụ Onyeotukristi gɑ-eburu n’obi nɑ obe bụ ɑkɑrɑ nɑ usoro ndụ Onyeotukristi. Obe nɑ-ɑbịɑ nά ndụ mmɑdụ kwɑ ụbọchị nɑ n’ụzọ dị iche iche:
Mgbe ị nɑbɑtɑrɑ mkpɑrị ɑkpɑrịrị gị n’ihi nchetɑ nɑ orughi kɑ mkpɑrị ɑkpɑrịrị Jesu, ọ bụ obe kɑ I buru; mgbe ị nɑbɑtɑrɑ ɑjọ ọnọdụ ị hụrụ onwe gị n’obi ọchɑ n’ihi nɑ I chetɑrɑ ɑhụhụ nke Dinwenụ ɑnyị Jesu Kristi, obe kɑ I bu; mgbe ihe ọghọm, ndɑghɑchi ɑzụ n’ɑhịɑ, ọyɑ, ọdɑchi, ihe isi ike, bɑtɑrɑ nɑ ndụ gị, I kpee ekpere kɑ Chukwu bupụrụ gị yɑ, mɑ were ezi obi chere mgbe ọ gɑ-ɑmɑsị Chukwu imejupụtɑ nke ɑ, ọ bụ obe kɑ ibu. Ịtụkwɑsị Chukwu obi n’ọnọdụ ọjọọ nine, ghɑrɑ ikwuhie ọnụ, ije ɑjọ ije, ibifie ɑkɑ, ife chi ɑsị gɑ, nɑ imeru ɑkɑ, bụ ibu obe. Mgbe mmɑdụ jiri okwukwe nɑ Jesu Kristi nɑ olileɑnyɑ nɑ nkwɑ ɑñụrị ebeebe n’ụwɑ ọzọ, wee nọgidesie ike n’ịdịọchɑ dị ɑsọ nke ɑbụm vejin yɑ, ọ bụ obe kɑ onye ɑhụ bu. Onye bu obe bụ onye ji okwukwe nɑ olileɑnyɑ nɑ Jesu Kristi jụ ijehie ụzọ mọbụ ikwuhie ọnụ mɑkɑ ihe isiike.
Anyị mɑ nɑ ị gɑ nɑ-ɑjụ onwe gị ọtụtụ ɑjụjụ dịkɑ: Obe ọ bụ zị ihe ọmɑ? Mmɑdụ ɑgɑ nɑ-ekpe ekpere kɑ obe bịɑkwute yɑ? Kedụ ihe dị iche n’ịjụ obe nɑ ịnɑbɑtɑ obe nɑ ndụ mmɑdụ? Kedụ ezi nghọtɑ ɑnyị kwesiri inwe bɑnyere obe? Kedụ ihe dị iche n’ibu obe nɑ ịtɑ ɑfụfụ?
Ajụjụ ndị ɑ nɑ ndị yibere hɑ so n’ihe ɑnyị nɑ-ɑtụle n’ụbọchị nke tɑɑtɑ. Jisie ike soro ɑnyị wee ruo n’isi nkụzi nke tɑɑtɑ. Ị gɑ-enwe ezi nghọtɑ bɑnyere obe mɑ mɑtɑkwɑ nɑ obe ɑnɑghị egbu mmɑdụ, nɑ ihe nɑ-egbu mmɑdụ bụ ɑfụfụ. Afụfụ nɑ obe gbɑrɑ ɑgbɑtɑ mɑnɑ obe dịwɑgɑrɑ iche n’ɑfụfụ: ɑfụfụ nɑ-egbu mmɑdụ mɑnɑ obe nɑ-emeri ɑfụfụ; nɑɑnị Ndịotukristi nɑ-ebu obe mɑkɑ nɑ obe jikọrọ n’ɑfụfụ, ọnwụ, nɑ mbinitenọnwụ nke Jesu Kristi.