NKWỤSỊ NKE IRI NA ABỤỌ
Jesu Anwụọ n’elu obe
Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele
Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa
Jesu nọ n’ụdị Chukwu, mana o jighị aka abụọ ghado ụdị Chukwu ya; kama ọ bịara hụchaa onwe ya were ụdị nwaodibo, a mụọ ya ka mmadụ. Mgbe a hụrụ ya n’ụdị mmadụ. O budara onwe ya ala huwe isi ruo n’ọnwụ, bụrụgodu ọnwụ n’elu obe. Ya mere Chukwu bulie ya elu, nye ya aha ka aha niile, nke na-akpọọ aha Jesu, onye ọ bụla nọ n’eligwe ma ọ bụ uwa ma ọ bụ n’okpuru ụwa ga-egbu ikpere n’ala kwupụta na Jesu bụ Dinwenụ.
Sekpulu Ala
Onye ga-ekewapụ anyị n’ịhụnanya Kristi? Ọ bụ mkpagbu ka ọ bụ ahụhụ, ka ọ bụ mmegbu, ka ọ bụ oke agụụ, ka ọ bụ ịgba ọtọ ka ọ bụ ize ndọ ka ọ bụ mmagha? Oolo! N’ihe niile ndị a, anyị karịrị dikeọgụ n’ime onye ahụ hụrụ anyị n’anya.</p>
Onyenwe m, nyenụ m amara gị ka m were ike m niile na-arụ ọrụ ọma gị mgbe niile n’atụghị egwu ọ bụla.
Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile
E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.
Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;
Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;
Nna anyị nọ n’eluigwe, Ekele Marịa , Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ
Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.
Ọha: Mere anyị ebere
Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;
Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen