NKWỤSỊ NKE IRI NA OTU
A Kpodo Jesu n’obe
Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele
Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa
Dịka Mosis si welite agwọ elu n’ime ọzara ka a ga-esi ewelite Nwa nke Mmadụ elu, ka onye ọ bụla kwerela na ya wee nweta ndụ ebighịebi. E si n’ala welite m elu, a ga m adọtara onwe m mmadụ niile. Mgbe Jesu burutere obe ya na Gọlgọta, ha akpọgbuo ya n’etiti ndị ohi abụọ. Ndị mmadụ guzoro ele ya. Ndi ji ike ọchịchị na-akọcha ya, ndị agha ji ya na-akpa ọchị. Ma Jesu sị: “Nna, biko gbaghara ha maka na ha amaghị ihe ha na-eme.
Sekpulu Ala
O mezuola ihe e dere n’akwụkwọ nsọ sị: “Ndị mmadụ na-akọcha m, na-eleda ma anya, ha ji m akpa ọchị na-emenyere m ọnụ, na-efere m n’isi. Ndị ajọ mmadụ agbaala m gburu gburu. Ha dupuru aka m na ụkwụ m. E nwere m ike ịgụ ọkpụkpụ m niile ọnụ
Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile
E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.
Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;
Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;
Nna anyị nọ n’eluigwe, Ekele Marịa , Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ
Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.
Ọha: Mere anyị ebere
Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;
Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen