NKWỤSỊ NKE IRI
Agba Jesu Ọtọ
Onye Ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele
Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa
Ndị agha kpọgburu ya bịara kee uwe ya ụzọ anọ, ọbụla eburu otu ụzọ. Ma ha lechara uwe nruala ya na-enweghị njikọ ọ bụla sị: “Onye adọkakwala nke a, kama ka anyị feere ya nza, onye ọ manyere ya werechaa”. O mezuola ihe e dere n’akwụkwọ nsọ sị: “Ha ekeriela onwe ha uwe m, bịa fee nza maka uwe nruala m”.
Sekpulu Ala
A gbara m ọtọ pụta n’afọ nne m, a ga m agba ọtọ ala mmụọ, Chineke wetara, Chineke ewerekwala, Ngọzi dịrị aha Chineke.
Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile
E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.
Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;
Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;
Nna anyị nọ n’eluigwe, Ekele Marịa , Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ
Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.
Ọha: Mere anyị ebere
Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;
Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen