Nkwụsị Nke Itoolu
Jesu Adaa nke Ugboro Atọ
Onye Ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele
Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa
Awufuola m ka mmiri, njikọ ọkpụkpụ m niile agbakwarachaala. Obi m edeela ka mkpụrụ mmiri wụbam n’afọ. Ike (strength) m akpọọla nkụ ka mpekele ite. Ire m ataparala m n’agba m. Ị tụọla m n’uru nke ọnwụ.
Dinwenụ, lee, Ị hụla na abụrụla m onye ajụrụ ajụ. ọ bụ na ihe a agbasaghị ụnụ niile na-agafenụ? Letanụ ma o nwere ahụhụ ka nke a e bunyere m. Ihe ndi a ka m na-ebere akwa; anya mmiri na-ehusi m n’anya maka na e nweghị m onye nkasị obi nke m na e nwe onye na-asị m jisie ike. (Abụakwa 1:11-12, 16).
Sekpulu Ala
Chineke ji ike niile, nye m amara gị n’uju ka m were kwudosie ike ruo na ngwụcha. E kwela ka obi daa m mba mbge ihe na-esiri m ike
Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile
E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.
Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;
Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;
Nna anyị nọ n’eluigwe, Ekele Marịa , Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ
Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.
Ọha: Mere anyị ebere
Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;
Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen