Nkwụsị Nke Asatọ
Jesu Ezute Ụmụnwaanyị Jerusalem
Onye Ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele
Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa
Igwe ndị mmadụ so Jesu na-aga n’ụzọ, tinyekwara ụmụnwaanyị na-emere ya ebere na-ebere ya akwa. Ma Jesu atụgharịa sị ha: “Ụmụada Jerusalem, ụnụ eberela m akwa; kama bewerenụ onwe ụnụ na ụmụ ụnụ akwa.
A nụrụ m olu na-ebe akwa arịrị, na-eru nnukwu ụjụ na Rama. Rechel na-ebere ụmụ ya akwa. Ọ jụla ịnara nkasi-obi maka ụmụ n’ihi na ha adịghịkwa. Dinwenụ kwuru sị: Ebekwala akwa ọzọ; Hichaa anya mmiri maka na ha ga-esi n’ala ndị iro alọghachi. (Jeremaya 31:15-16)
Sekpulu Ala
Dinwenu m anapụkwala m ndị nkasịobi mgbe m nọ na mkpa. E kwela ka ọnwụnwa merie m, ma mee ka m merie ọnwụnwa.
Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile
E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.
Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;
Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;
Nna anyị nọ n’eluigwe, Ekele Marịa , Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ
Onye-ndu:
Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.
Ọha: Mere anyị ebere
Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;
Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen