NKWỤSỊ NKE ASAA
Jesu Adaa nke Ugboro Abụọ
Onye Ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele
Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa
Ndị nke m, kedụ ihe m mere ụnụ? O lee ihe m ji megide ụnụ? Zanụ m! E ji m achịcha ọcha zụọ ụnụ n’ịkpa; mana ụnụ akụdala m ala pịarụchaa m ahụ.
Sekpulu Ala
Biko Dinwenụ m, e kwela ka m bụrụ ohu njọ ọbụla. Mee ka m nwere onwe m, were ike m niile, echiche m niile, na mmụọ m niile bịa gbaara gị odibo n’ụzọ kwesịrị ekwesị.
Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile
E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.
Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;
Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;
Nna anyị nọ n’eluigwe, Ekele Marịa , Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ
Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.
Ọha: Mere anyị ebere
Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;
Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen