NKWỤSỊ NKE ISII
Veronika Ehichaa Jesu Ihu
Onye Ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele
Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa
Mgbe nwa nke mmadu ga-abia n’ebube ya n’ọgbara ndị mmụọọma niile, ọ ga-agwa ndị eziomume; “Mgbe agụụ na-agụ m, ụnụ nyere m nri m rie; Mmiri na-agụ m, ụnụ nyere m mmiri m ñụọ; mgbe m bụ onye ọbịa, ụnụ nabatara m. Agba m ọtọ, ụnụ eyiwe m akwa, mgbe m na-arịa ọrịa na mgbe m nọ n’ụlọ mkpọrọ, ụnụ bịara leta m.
Onye kwupụtara m n’ihu ndị mmadụ, aga m ekwupụta ya n’ihu Nna m nọ n’eligwe; ma onye ọbụla gọlaghara m n’ihu ndị mmadụ, aga m agọlagha ya n’ihu nna m nọ n’eligwe.
Sekpurunụ Ala
Chineke m, nyenụ m ndị ezigbo ikwu na ibe na ndị enyi ga-anọnyere m, ma na nsogbu ma n’añụrị. Mee ka m wepụta obi m gbaara gị akaebe n’ụwa a, ka i wee kwupụta aha m n’ihu Nna gị.
Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile
E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.
Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;
Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;
Nna anyị nọ n’eluigwe, Ekele Marịa , Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ
Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.
Ọha: Mere anyị ebere
Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;
Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen