NKWỤSỊ NKE ISE
Simion Enyere Jesu Aka Ibu Obe
Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele
Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa
Mgbe ha nyechara Jesu mkparị, ha yipụ ya uwe-nru-ala ahụ, yiwe ya uwe nke ya, duru ya pụọ gaa ikpọgbu ya. Ma mgbe ha na-aga, ha hụrụ Simion onye Sirin, manye ya ka o buru obe Jesu.
Sekpurunụ Ala
A na m agwa ụnụ, ọtụtụ ga-esi n’ọwụwa anyanwụ n’ọdịda anyanwụ bịa nọnyere Ebraham, Aịzik na Jekọb n’alaeze eligwe.Ma a ga-achụpụ ụmụ alaeze na mbara ezi kụrụ itiri; ebe sọ ibe akwa na-ịta ikikere eze ga-adị. (Matiu 8:11-12).
Chineke m, mee ka m were obi añụrị nara obe niile Ị ga-ezitere m na ndụ m. E kwela ka achụpụ m n’ala eze gị.
Nna anyị nọ n’eluigwe, Ekele Marịa , Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ
Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.
Ọha: Mere anyị ebere
Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;
Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen