NKWỤSỊ NKE ANỌ
Jesu Ezute Nne ya N’Ụzọ
Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele
Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa
Mgbe Jesu hụrụ ebe nne ya kwụrụ n’ukwu obe, bịakwa hụ nwa-azụ ahụ nke ọ hụrụ na anya n’akụkụ ya. Ọ sị: “Nne, lee nwa gị”, Ya gwa nwa azụ ahụ, “Lee nne gị.” Nwa-azụ ahụ akpọrọ ya mgbe ahụ lawa n’ụlọ ya.
“Lee edebere nwata a maka ọdịda na mbilite ọtụtụ mmadụ n’Izrel. ọ bụ ihe ọmụma-atụ a ga-ekwutọ ewkutọ ka e were kpughee echiche nọ ọtụtụ mmadụ n’obi. Ma mmagha ga-amawa gị obi. Onyenweanyi, mee ka m were nne gị dị asọ bụ Marịa ka ezigbo nne m, hụ ya n’anya ka isi hụ ya n’anya, na-asọpụrụ ya maka ihi gị.
Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile
E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.
Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;
Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;
Nna anyị nọ n’eluigwe, Ekele Marịa , Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ
Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.
Ọha: Mere anyị ebere
Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;
Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen