NKWỤSỊ NKE ATỌ
Jesu Adaa nke Mbụ
Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele
Ọha Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa
Ndị nke m, kedụ ihe m mere ụnụ? Kedụkwanụ ihe m ji megide ụnụ, Zanụ m! E duru m ụnụ ọgụ afọ abụọ dufee n’ọzara. E ji m achịcha nke eligwe zụọ ụnụ, dubata ụnụ n’ala nke jupụtara na mmiri ara na mmanụ-añụ. Ma ụnụ ejila obe kwụọ onye nzọpụta ụnụ ụgwọ.
Sekpurunụ Ala
Ma ọ bụ ọrịa anyị ka o bu; bụrụkwa ahụhụ anyị ka ọ na-edi. Ma anyị chere na ọ bụ nwa onye ụwa ọjọọ, nwa-onye Chukwu megburu emegbu. (Aịzaya 53).
Chineke m, nye m amara gị n’uju ka m were obi ọcha na obi añụrị buru obe m ụbọchị niile wee na-eso gị
Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile
E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.
Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;
Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;
Nna anyị nọ n’eluigwe, Ekele Marịa , Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ
Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.
Ọha: Mere anyị ebere
Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;
Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen