NKWỤSỊ NKE ABỤỌ
Jesu Eburu Obe Ya
Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele
Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa
KAỊFAS eziga Jesu na nke Paịlet, onye lechara ya kwupụta sị: “O nweghị ihe ọjọọ ọbụla m hụrụ nwoke a mere” Paịlet ezigara ya Herọd. Herọd ajụchaa ya ajụjụ zighachiri ya Paịlet. Paịlet na Herọd ejiri ya meziri esemokwu dị n’agbata ha abụọ. Paịlet abịa ma Jesu ikpe ọnwụ (Luke 23:1, 4, 1-12)
Sekpurunụ Ala
Gịnị kpatara ụmụ-mba ji arọ iro? Kedụ ihe ha jiri arọ iro na-enweghị isi? Ndị eze ụwa adọkọtala ukwu gbaa izu ha ji emegide Dinwenụ na onye O-Tere-Ude. Obinigwe nọ na-achị ha ọchị. Osebụrụwa achịgbuola ha n’ọchị.</p>
Onyenweanyi, mee ka anyị kwụrụ n’ụzọ eziokwu gị mgbe niile, ghara iji egwu ndị mmadụ emehie gị. Mee ka ndị na-achị obodo tinyere Nzuko gị aka n’ọrụ ịgbasa ikpe nkwụmọtọ gị.
Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile
E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.
Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;
Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;
Nna anyị nọ n’eluigwe, Ekele Marịa , Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ
Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.
Ọha: Mere anyị ebere
Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;
Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen