NKWỤSỊ NKE MBỤ
A ma Jesu ikpe ọnwụ.
Onye Ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele
Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa
KAỊFAS asị Jesu: “Eji m aha Chukwu dị ndụ asị gị ñụọrọ anyị iyi ma Ị bụ Kristi, Nwa nke Chukwu, “Jesu azaa ya: “Ikwuola ya, mana ana m agwa gị na e mechaa, ị ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka Ọ nọ n’aka nri nke Ike, si nurukpu nke Igwe na-abịa. Kaịfas adọwaa uwe nruala ya tie mkpu sị: “Okwuola arụ! Ndị mmadụ ekwuhachi sị: Kpọgbuo ya! Kpọgbuo ya” Ha bido bụwa ya asụ n’ihu; kụwa ya ihe.
Sekpurunụ Ala
Ndị iro m na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla siri oke ike. Ndị kpọrọ m asị na nkịtị akarịala; ndị iro m ji ihe ọjọọ akwụ m ụgwọ iheọma, maka na ana m eso ụzọ eziomume. (Abụọma 38:19-20). Onyenwe m, nye m ndidi ka m ghara ikwughie ọnụ mgbe ihe na-esiri m ike. E kwela ka ikwu na ibe kọ m. Nye m obi siri ike, nke m ga-eji emeri ọnwụnwa niile ga-abịakwute m na ndụ m.
Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị. Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ; Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla; Nna anyị nọ n’eluigwe, Ekele Marịa , Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ
Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.
Ọha: Mere anyị ebere
Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;
Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen