EKPERE MMEGHE
Jesu kpọrọ Pịta, Jemis na Jọn baa n’ogige Getsemanị sị ha: “Ọnụma juru m mmụọ na-egbu m egbu, nọrọnụ ebe a, soronụ m chebe nche ka ụnụ ghara ịdaba n’ọnwụnwa”
Ọ pụọ kpee ekpere sị: Nna, o bụrụ na ihe a enweghị ike ịgafe m beelụsọ m ñuru ya, ka uche Gi mee. Mgbe ọkpụ okwu a n’ọnụ, Judas nwaazụ ahụ rere ya akpọrọ igwe mmadụ bucha mmagha na okpiri bata
Ha jide Jesu kpụgara ya Kaifas onyeisi nchụaja.
Sekpurunụ Ala
Ndị iro m niile ezukọọla na-agbara m ajọ izu; na-echere m echiche ọjọọ. Nke ka nke bụ na enyi m nọ m n’obi, onye m tụkwasara obi m na ya agbala m nkele ụkwụ (heels). Onyenwe m biko mere m ebere kulite m ka m bịa kwụọ ha ụgwọ ya.
Ọha:
Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile
E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.
Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;
Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;
Nna anyị nọ n’eluigwe, Ekele Marịa , Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ