MMECHI
Onye-ndu: Dinwenụ anyị huwere isi garuo n’ọnwụ
Sekpuru ala zaa: ỌNWỤ N’ELU OBE
Geenụ ntị ka m gwa ụnụ otu ihe omimi. Anyị niile agaghị adacha mba n’ụra ma anyị niile ga-agbanwocha. N’oge ntakịrị n’otu ntabi anya n’ụda opi-igwe. Maka na-aga egbu opi-igwe ndị nwụrụ anwụ ebilite n’ụdị anwụ anwụ, anyi niile abịa gbanwoo. Maka na ahụ anyị nke a na-emebi emebi ga-abịa yiri emebighị emebi, ahụ anyị nke a na-anwụ anwụ abịa bụrụ anwụ anwụ. Mgbe ihe na-emebi emebi ga-abịa yiri emebighị emebi, ihe nke na-anwụ anwụ abịa bụrụ anwụ anwụ, mgbe ahụ ka a ga-emezu ihe e dere sị: “E loole ọnwụ na mmeri”.
Ọnwụ! O lee mmeri gị
Ọnwụ O lee ụfụ gị? (1 Ndi Korint 15:51-52).
Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile
E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.
Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;
Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;
Nna anyị nọ n’eluigwe, Ekele Marịa , Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ
Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.
Ọha: Mere anyị ebere
Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;
Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen