NKWỤSỊ NKE IRI NA ANỌ
A donye Jesu n’ili
Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele
Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa
Na mgbede ka otu ọgaranya onye Arịmatịa, aha ya bụ Josef onye na-esokwa Jesu ji bịa rịọ Paịlet ka o bunye ya ahụ Jesu. Paịlet enye iwu ka e bunye ya. Josef e were akwa ụlarị ọcha fụọ ahụ Jesu dọnye ya n’ili ọhụrụ o gwurula onwe ya n’okwute, bịa kwara nnukwu okwute kwachie ọnụ ili lawa.
Nke a bịa mezuo amụma e buru sị: “E mekọtara ili ya na nke ndị njọ, ya na ọgaranya nọkwa n’ọnwụ ya.” Ya adọnye ahụ ahụ n’ili omezirila onwe ya. (Aịzaya 53:9. 1 Ndi Eze 13:30).
Sekpulu Ala
Chineke m, mee ka ndị nọ n’ọchịchị nwee obi mmadụ were obi Chineke na-achị. Mee ka ndị ọgaranya anyị were anya a na-asọrọ ha n’obodo na-arụpụta ọrụ nke nzọpụta.
Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile
E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.
Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;
Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;
Nna anyị nọ n’eluigwe, Ekele Marịa , Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ
Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.
Ọha: Mere anyị ebere
Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;
Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen