Nkwụsị Nke Iri na Atọ.
E butuo Ahụ Jesu n’obe
Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele
Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa
Ndị agha bịara gbajie ụkwụ onye nke mbụ na onye nke abụọ a kpọgbukọtara ha na Jesu. Ma mgbe ha bịarutere ebe Jesu nọ, ha hụ na ọ nwụọlarịị, ha agbajighị ya ụkwụ. Ma otu n’ime ndị agha e were ube mapuo akụkụ ya, ọbara na mmiri agbapụta otu ihu ahụ. Nke a bụ iji mezuo ihe akwụkwọ nsọ kwuru sị: “O nweghị otu ọkpụkpụ ya aga agbaji.” “Ha ga-elekwasị ya anya bụ onye nke ha jiri ube mapuo.”
Sekpulu
Chineke m, nye m onyinye nke ibi ndụ dị mma, nwụọ ọnwụ dị mma, wee soro keta añụrị ebighị ebi n’eligwe.
Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile
E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.
Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;
Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;
Nna anyị nọ n’eluigwe, Ekele Marịa , Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ
Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.
Ọha: Mere anyị ebere
Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;
Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen