Maka Mkpụrụobi Nọ na Pọgatri
Mkpụrụobi ndi na-esi na Pọgatri apụta n'oge nhụghari Achicha na Mmanya nke
Masi na-adi oriri nke Onyenweanyi, nke Nne anyi di asọ, na Pọgatri
na-enweta ọtụtụ amara site n'ekpere e hụnyere maka ha ụbọchi a mụrụ ha,
ụbọchi e mere ha Mmirichukwu, na n'ụbọchi emume e ji echeta ọnwụ ha
kwa afọ.
Ndi mmadụ ga-ekpeere anyi ekpere nke ukwuu oge anyi nwụrụ ma ọ bụrụ na
oge anyi nọ n'ụwa na anyi hụnyere ekpere na eziọrụ maka mkpụrụobi ndi
ahụ chọrọ enyemaaka. Etu ahụ ka Jesu ga-esi meere anyi ebere nke ukwuu
ma anyi nọrọ na Pọgatri.
EKPERE
Nne anyi di asọ riọrọ ka anyi na-ekpe ekpere nke ukwuu maka mkpụrụobi
ndi ahụ chọrọ enyemaaka site n'ikpe ekpere ndi a:
Ekwe m na Chukwu...ise.
Ekele Ezenwaanyi di aso... otu.
Nna anyi nọ n'Eluigwe.-..otu.
Ekele Maria...otu. Otito diri Nna...otu.Ekpere maka ndi nwụrụ anwụ.
(Nye ha ezumiike ebeebe O Dinwenụ, ka ihe nke dụ Ebeebe chakwasi
ha ka mkpụrụobi ha zuru ike na ndọkwa. Amen.)...otu
Nne anyi di asọ siri na "anyi ga-azọpụta ọtụtụ mkpụrụobi, ọtụtų mkpuruobi”
ma ọ bụrụ na anyi kpee ekpere ndi a.
N'akwụkwọ nsọ, e dere sị, “N'ihi na ọ bụ echiche dị asọ ma dikwaazi mma
bụ ikpeere ndi nwụrụ anwụekpere ka e wee tọhapụ ha na njọ."
(2 Makabiis 12:46)
O nwere įndolinjensį sooso mkpụrụobi no na Pogatri na-enweta oge
ọbụla onye òtù Kristi jiiri obi ya niile gaa n'ili ozu kpeere ndi
nwụrụ anwụ ekpere.