Ekpere Maka Inweta Amara Sitere N'Aja Missa A Chụrụ n'Akụkụ Uwa Niile
Nna dị Ebeebe, anyị ejiri obi umeala hunyeere Gị nsonye anyị na nke
mmadu niile no n'uwa,site na mbido ruo na njedebe nke ụwa, sonyere na Missa
niile e kwugoro, ma o bụ ndị a ga-ekwu n'odịnịihu.
Anyị ehụnyeere Gị ufu niile, ahụhụ niile, ekpere niile, aja niile, anụri
niile na ezumiike niile nke ndụ anyị, tinyeere ndị nke ezigbo Dịnwenụ anyị
Jesu Kristi oge ọ no n'ụwa.
Ka obara Kristi kasị oke onụ; obara Ya niile, onya Ya niile na obi mgbu
Ya niile, zoba anyị site n'Obi Uru na Obi dị Ocha Marịa. Amen!
Ọ dị mma ka a na-ekpe ekpere a kwa ụbọchị.
Mee ka a mara maka ya.
Ezigbo Filomena dị aso, rịotaara anyị ịdịocha nke akonauche na nke obi,
nke ga-eduga anyị n'inwe ịhunaanya zuru oke n'ebe Chineke no.