Ekpere Ma A Natasia Oriri Di Asọ, Ma Ọ Bu Missa Gasia
Aririọ n'Ihu Obe Dị Asọ
Lee,O Jesu kacha afọọma na utọ, ewere mu onwe m sekpuru n'ihu Gi,
na-ariọ Gi na nnukwu aguy nke mkpuruobi m, ka I tinye n'ime obi m
ike mmetu nke okwukwe na nchekwube na ihunaanya, na ezigbo ebere maka
njọ m, na
izuzu siri ike nke mmeghari,
ka mụ no ugbu a na-eche, na-ero n'ime obi m maka Onya ise nke Gi di oke ọnụ,
na nnukwu ebere na mwute nke mkpuruobi m. N'otu ihu ahu ka mụ na-ahu
Onya Gi di oke ọnụ anya, ana mụecheta ihe onye amụma bụ Devid kwuru
n'aha Gịna n'ebe Į nọ sį, “Ha kpọpuru aka m na ukwu m,guọ ọkpụkpụ
m niile ọnu.”
Nna anyi nọ n'Eluigwe, Ekele Maria na Otito diri Nna, maka poopu na
Ųka Katọlik
A na-enweta indọlijensi zuru oke ma e kpee ya ka a natasiri oriri nsọ