Elekere Atọ nke Ehihie Elekere nke Nnukwu Ebere
Jesu gwara Fọstịna si,“N'elekere atọ rịọ ebere mụ,ọ kachasị maka ndị njọ.
Obụladị n'otu ntabianya, banye onwe gị n'ime Ahụhụ na ọnwụ m,ma ọ kachasị
n'oge ahụ a gbahapụrụ m n'ime oke Uru.”
Nke a bụ elekere nke nnukwu ebere maka ụwa niile. ...
N'elekere a, ọ nweghị ịhe mụ agaghị emeere mkpụrụobi ahu rịọrọ m arịrịọ
site n'erere nke Ahụhụ na ọnwu m.
EKPERE MAKA EBERE N'ELEKERE ATỌ
Ị nwụrụ, O Jesu, mana isi Mmalite nke Ndụ hụpụtara maka mkpụrụobi ga.
Oke mmiri nke ebere meghepụụrụ ụwa niile. O Isiiyi nke Ndụ
Ebere Chineke dị Omimil Kpuchie mmadụ niile nọ n'ụwa, ma meghepụrụ
anyị onwe Gị.
O ọbara na Mmiri nke gbapụtarasiten'Obi Jesu dịka Isiiyi nkeebere
makaanyị atụkwasara m obi m na Gị. (ugboro atọ)
CHAPLETI NKE EBERE CHUKWU
Kpee otu Nna anyị nọ n'eluigwe, Ekele Marịa,Ekwe m na Chukwu
A bịazịa na mkpuru nke Nna anyị nọ n'Eluigwe ọbula, e kpee ekpere a:
Nna di Ebeebe,
Ehunyeere m Gị Ahy Na ọbara Na Mkpuruobi
Na ịbu Chukwu nke Nnwa Gị
Į huru n'anya nke ukwuu
Bu D nwenu anyị Jesu Kristi,
Iji kwuọ ugwọ dịịri njọ anyị
Na nke uwa niile.
A bịa na mkpuru nke Ekele Marịa, e kpee ekpere nke a:
N'ihi Ahụhụ na ọnwu ya di oke mwute,
Meere anyị ebere; Meere uwa niile ebere.
A bịazịa na mmechi, kpee ekpere nke a ugboro atọ:
O Chukwu dị asọ,
Onye dị asọ dị ike,
Onye dị asọ dị anwu anwu;
Meere anyị ebere; Meere uwa niile ebere.
EKPERE
Chịneke dị Ebeebe,Onye ebere Ya enweghị njedebe, ulọ aku nke ntasiobi
enweghị ọgwugwu.abawanye n'ime anyị. Ka ọ ga-abu, n'ime oge oke
nsogbu, ka anyị ghara inwe nkoropuobi ma ọ bu tufuo olileanya,
kamasite na nnukwu ntukwasịobi ka anyị were onwe anyị tinye n'Uche Amen.
EKPERE MAKA EBERE CHUKWU
O Chineke di ukwuu juputara n'ebere, Įdịmma dị ebeebe. Taa, mmadu niile
nọ n'uwa na-ebeku Ebere Gị na obimmetuta Gị site n'ọnọdụ nsogbu ha
enweghị njedebe. O Chịneke, ọ bụ site n'oke olu nke nsogbu ha ka ha sị
eti mkpu.
Chịneke dị obiọma, ajukwala ịnabata ekpere nke ndị ọbịa a nọ n'uwa!
O Oseburuwa, Įdimma karịrị anyị na nghọta,Onye mazuuru nsogbu anyị niile
kpamkpam, bịa marakwaazị na anyị apughị ịbịakwute Gị site n'ike anyị.
Anyị ariọ gị ka I were amara Gi buweere anyi uzọ, ma kwudosie ike
na-abawanye Ebere Gi n'ime anyi ka anyi wee kwusie ike n'ime Uche Gị dị Asọ n'oge ndụ anyi na n'oge onwụ.
Ka Ebere Gi puru ime ihe niile chedo anyi n'uta ndi iro nke nzọputa anyi,
ka anyị wee site na ntụkwasiobi, dịka umu Gị, chere obịbịa ịkpeazu Gị,
ubọchị ahu naanị Gị maara.
Anyị chekwubere ịnwetazu ịhe niile Jesu kwere anyị na nkwa
n'agbanyeghị adịghị ike anyị niile.N'ihi na Jesu bụ Olileanya anyị,
anyị ga-esite n'obi ya juputara n'ebere, dịka site n'onuuzọama ghe oghe,
wee gafere gaa eluigwe. Amen.