Nkenke Ụzọ nke Obe
(Nke a bụ Ųzọ nke Obe ndị Fada (ndi monk) ndi otu nke Fransis dị asọ na-agu, ma ha norọ na njem)
Nkwụsi nke Mbụ
A maa Jesu ikpe ọnwụ
O Jesu juputara n'umeala, I kpesaghii mgbe Į nọna nsogbu. Kuziere m idina-anabata ọnwụnwa na-ejighi mkpesa.
Nkwụsi nke Abụọ
Jesu Eburu Obe Ya
Jesu m, Obe a kwesiri ibu nke m, o bụghi nke Gi,ọ bụ njọ mụ kpọdoro Gị n'obe.
Nkwụsi nke Atọ
Dinwenụ anyi Adaa nke Mbụ
O Jesu, site n'ada mbụ a Į dara, ekwela ka m daba n'ime nnukwu njọ.
Nkwụsi nke Anọ
Jesu Ezu Nne Ya
O Jesu, mee ka ọ ghara inwe ihe ọbụla nke na-ejikọta mmadụ na ibe ya pụrụ iwezuga m n'iso Ųzọ nke Obe, n'agbanyeghi etu o siri sie ike.
Nkwụsi nke Ise
Saimọn, Onye Sirin, Enyeere Jesu Aka n'Ibu Obe Ya
Saimọn nyeere Gi aka n'ejighį obi ya niile, meenụka m were ndidi taa ahụhụ niile maka gi.
Nkwụsi nke Isii
Veronika Ehichaa Ihu Jesu
O Jesu, I mere ka odidi Gi dị asọ fụpụta n'ichafụ Veronika, si etu ahụ kanye ha n'ime obi m ka ha ghara ihicha ehicha.
Nkwụsi nke Asaa
Ada nke Abụọ Jesu Dara
Ezigbo Dinwenụ, site n'ada nke abụọ I dara,chekwaba m ka m ghara idaghachi azụ na njọ.
Nkwụsi nke Asatọ
Jesu Akasie Umụnwaanyi Jerusalem Obi
oge ka I kwuru si, “Agbagharala gi ọtụtụ njọ, n'ihi na į hụrụ M n'anya nke ukwuu.”
Nkwụsi nke Itoolu
Ada nke Atọ Jesu Dara
O Jesu, oge ike gwuru m n'ogologo ije nke ndụ,bụrụ ike m na įkwudosi ike m.
Nkwụsi nke Iri
E Yipuru Jesu Akwa Ya
Ezụlahụla mkpuruobi m uwe ọcha ahụ na-egosi inọ n'ọnọdụ amara, ezigbo Jesu,yibe mụ uwe nke ncheghari na ime ọpipia.
Nkwụsi nke Iri na Otu
A kpodo Jesu n'Obe
I gbaghaala ndi iro Gi, Chineke m, kuziere mụigbaghara mmegide bịa chezọọkwa ha.
Nkwụsį nke Iri na Abụọ
Jesu Anwụọ n'Obe
Jesu m, ọbụladi ka Į na-anwụ, Obi Gi di asọ ka na-etiriri eti n'ihi ihụnaanya I nwere n'ebe ụmụ Gị ndi njọ nọ.
Nkwụsi nke Iri na Atọ
E si n'obe buda Jesu
O Nne jụpụtara n'obi mwute, nara m n'ime aka gi, ma wetaara m ncheghari zuru oke maka njọ m ga.
Nkwusi nke Iri na Anọ
E lie Jesu n'ime ili