Ezigbo Ihe Anyị Na-erite n'Isonye na Missa Dị Asọ
1. Missa bụ ịga n'ihu n'Aja nke Kalvarị.
2. Missa ọbụla dị ire dịka Aja ahụ Onyenweanyị Jesu Kristi chụrụ site na
Ndụ ya, Ahụhụ ya na ọnwụ ya.
3.Uzọ kachasị dị ire isi mee ọpịpịa maka njọ gị bụ Missa dị asọ.
4.Missa niile ị nụgoro ga-abụrụ gị nnukwu ihe nkasịobi oge ị ga-anwụ.
5.Missa ọbụla ga-eso gị gaa n'oche ikpe. N'ebe ahụ o ga-arịọrọ gị
maka mgbaghara.
6.Site n'isonye na Missa dị asọ, ị nwere ike ịbenata ahụhụ dịrị njọ gị
nwaoge. Nke a bụ dịka erere I ritere ha.
7.Oge ị na-eji obi gị niile esonye na Missa dị asọ,
ị na-enye abụm mmadụ dị asọ nke Onyenweanyị Jesu Kristi nnukwu nsọpụrụ.
8.Jesu Kristi na-emejụpụta ọtụtụ ịhe kwesịrị ka ị mee ị meghịị,
tinyeere ịhe ndị ahụ ị leghaara anya.
9.Missa dị asọ na-emekwa ka ike Ekwensu nwere n'ebe ị nọ na-epelata.
Site na ya,
Jesu na-agbaghara ọbere njọ ndị ahụ I kwụpụtabeghị.
10. Isonye na Missa bụ ụzọ kachasịnu ị ga-esi
11. So otu Missa i sonyere na ya oge ị dị ndụ ga-abaara gi nnukwu uru karịa
ọtutu ndj mmadụ sonyere n'ihi gi ka į nwụsirį.
12. I na-eme ka oge pọgatrị gị na-epelata. A na-echekwaba gị na ịhe dịga
egwu, tinyeere nsogbu ga nke kaala ịdakwasị gị.
13. N'eluigwe, Missa ọbụla ị nụrụ na-eme ka ọnọdụ otito gị na-abawanye.
14. Na Missa, ị na-anata ngọzị ahu ụkọchukwu na-enye, nke Onyenweanyị
na-akwado n'eluigwe.
15. Oge ị nọ na Missa dị asọ. I na-esekpuru ala n'etiti igwe ndị mmụọọma,
bụ ndị jị nsọpụrụ dị egwu nọrọ n'ofufe nhunye nke Aja Missa.
16. A na-agọzị gị n'the niile ị na-eme n'ụwa.
Ọ bụ oge anyị ga-anọ na Ndu Ebeebe,ka anyị ga-enwe ike ịghọta n'uju na
ọ bụ ịhe ziri ezi bụ ịdị na-esonye na Missa dị asọ kwa ụbọchį.
Kpeere Ndi Ukọchukwu ekpere ka ha nwee ike ife n'asọ.