Akụkọ Maka Otu Poopu Nwụrụ Onye Na-anwụ Anwụ
Na Rom e nwere otu Poopu ahụ mere otụtụ nnukwu njọ. Oge o hụrụ na Dinwenụ Chineke ezitereela ya oke ọrịa nke pụrụ igbu ya,
ọ kpọrọ ndi Kadinal, ndị Bishọp, na ndi oke mmụta, si ha, “Ndi enyi mhụrụ n'anya, kedụ nkasiobi unu nwere ike inye mụ ugbu a
mhụrụ na m ga-anwụriri, ma taa ahụhụ ebeebe maka njọ m ga?” Onye ọbụla gbara nkiti. Ma otu ụkọchukwu nọ n'ime ha a na-akpọ Jọnụ
zara ya sị,"Nnaukwu, gini kpatara na I nweghi ntụkwasiobi n'Ebere Chineke?"
Ma Poopu ahụ siri ya,“Kedu nkasiobi I nwere ike inye mụ ugbu a m na-atụ egwu na m ga-ata ahụhụ ebeebe maka njọ m ga ma m nwụọ?”
Jọn zaghachirl ya si, “Echekwubere m na site n'ekpere atọ m ga-ekpeere gi, na Į ga-enweta nkasiobi.Chineke ga-emeere gi ebere." Ma mgbe ahụ,
poopu ahụ enweghizi ike ikwu okwu. Ụkọchukwu ahụ na ndi niile no ebe ahụ sekpuuru ala kpee otu Nna anyi Nọ n'Eluigwe na ekpere ndi a.
Ekpere nke Mbụ
Dinwenụ Jesu Kristi, Į bụ Nwa nke Chukwu na Nnwa nke Vejin Marja, Chukwu na Mmadụ. I ji maka anyi na ka I wee weta udo sọọ ọsisọ ọbara
n'ugwu nke Oliv. Maka nzopụta nke onye a na-anwụ anwụ, bụ...A... ka I jiri hunyeere Nna Gi nke Eluigwe ọnwụ Gi kasi di asọ.
Ka a gbaghara ya njọ ya niile, nke ọ bụ n'ihi ha ka o kwesiri ita ahụhụ ebeebe. Anyi riọrọ Gi nke a O Nna di ebeebe site na Nnwa Gị I hụrụ
n'anya bụ Dinwenụ anyi Jesu Kristi, Onye di ndu na-achi n'idikọ n'otu nke Mmụọ Nsọ site ugbu a ruo mgbe ebighi ebi. Amen.
Ekpere nke Abụọ
Dinwenụ Jesu Kristi, ọ bụ n'ihi anyi ka I ji were obi umeala nwụọ n'elu obe. I nwụru ka I wee weta udo site n'itinye uche Gị niile n'aka Nna
Gi nke Eluigwe. Zoputa...A...,ma zobeere ya ahuhu so njọ o megara site n'ihunyeere Nna Gi nke Eluigwe Onwụ Gi kasi di asọ. O Nna di Ebeebe,meere
anyi dika anyi riorọ site na Dinwenuanyi Jesu, Nnwa Gi, onye Gi na ya di ndu na-achi n'idiko n'otu nke Mmuọ Nsọ site ugbu a ruo mgbe ebighi ebi.Amen.
Ekpere nke Atọ
Dinwenu Jesu Kristi, Ngị kwuru okwu site n'ọnụ ndị Amụma sị: “Emeera m ka i bịakwute m site n'ịhụnaanya ahụ dị ebeebe." Ihụnaanya ahụ mere ka I
si n'eluigwe banye n'ahu nke Vejin.Ihunaanya ahu mekwara ka I sị n'ahu nke Vejin baa n'ime uwa a juputara na mkpa, nke Į nọrọ n'ime ya iri afọ atọ na atọ.
I gosipụtara nnukwu
Thụnaanya site n'tnye Ahụ Gị dị asọ ka ọ bụrụ ezi ka ọbụryezi ịhe ịhụnaanya mgbe ahụ ọnụnụ. I gosipụtara nnukwu nduuru Gi site na I kwetara I bụ onye e
ji eji,nkeonye okaikpe nke otu onye ọkaikpe gaa na ỌZO.
I gosipụtakwara nnukwu Thụnaanya mgbe I I kwere ka a ma gị ikpe onwụ, ikwetare ka ị nwụọ, na ka e lie Gị. I bilitere n'ezie wee gosi Nne gị dị asọ na
ụmụazu Gị dị aso onwe Gị.
I gosipụtara nnukwu lhụnaanya mgbe I sitere n'idi ike Gị rigoro n'Eluigwe wee nọrọ n'akanrị Chukwu Nna. I zidatara Mmụo Nsọ Gị n'ime obi
ndị umụazụ Gị na n'obi nke ndi niile nwere nchekwube na okwukwe n'ebe I no. Site n'igosipụta ihụnaanya Gị ahụ dị Ebeebe,
meghee Eluigwe taa ma kpọbata onye a na-anwụ anwụ,bụ...A...n'ime Alaeze Nna Gị nke Eluigwe,gbaghara ya njọ ya niile ka ọ wee soro Gị chịa
site ugbu a ruo mgbe ebighi ebi. Amen.
Poopu ahụ nwụzịrị, mana onye ụkọchukwu ahu nogidere n'ekpere ruo elekere itoolu nke ụtụtụ.Noge a, poopu ahụ bịakwutere ya. Ugbu a, ahụ ya
niile na-egbuke ka anyanwụ,uwe yana-acha ọcha dịka akụ mmiri igwe. Poopu ahụ kasịrị ya obi, o si n'ụkọchukwu ahụ,
“Ezigbo nwannem,n'atụmasighi na m kwesịrị ịbụ nnwaga-ata ahụhụ ebeebe,ma -ugbu a abụrụla m ọnwa nọ n'anụrị.Mgbe ahụ unu kpere ekpere mbụ, ọtụtụ
njọmsị n'ahụmd asịsịa
dika mmiri sị n'igwe. Ka unu kpere ekpere nke abụọ, e mere ka m dị ọcha otu onye uzu sị anụcha ọlaedo n'obooku. E mere ka m dịwanye ọcha oge unu
kpere ekpere nke atọ. Ka nke a na-eme,ahụrụ m eluigwe ka ọ meghere, Dinwenụ Jesu kwu n'akanri nke Chukwu Nna. O gwara m si, “Bia,n'ihi na a
gbagharala gi njọ gị niile. Ugbu a ị ga-anọrọzị n'ime ukpoeze Nna m ebeebe. Amen.
N'okwu ndị a, Mkpụrụobi m kewapụrụ n'ahụ m, ndị mmụọọma nke Chineke dụgara ya n'Anụrị Ebeebe.Mgbe ụkọchukwu ahụ nụrụ okwu nke a,ọ sịrị,
“O nna dị asọ, agaghị m enwe ike ịgwa ndị mmadụ ịhe ndị a n'ihi na ha agaghị ekwenye." Ma poopu ahụgwara ya sị, “Eziokwu ka m na-agwa gị,
mmụọọma nke Chineke nọdebere m jiri mkpuru asụsụ ọlaedo detusia ekpere ahụ ga, ka ha wee bụụrụ ndi niile ihe nkasiobi.
N'ihi nke a ọ bụrụ na mmadụ mere njọ niile dị n'ụwa a, ma n'oge ọnwụ onye ahụ na-aga enwe ike igụụrụ ya Ekpere ndị a,
a ga-agbaghara ya njọ ya niile. A ga-azọpụta mkpụrụobi ya n'agbanyeghi na ọ kwesiri įtagide ahụhụ ruo n'oge Ikpe Ikpeaz.
Onye nụrụ ka a gụrụ Ekpere ndị a agaghi anwụ na-akwadoghi akwado. Nke a metụtakwara onye a ga-anọ n'ụlọ ya wee gụo ha.
Ugbu a were ekpere ndi a debe na chapel ahụ a na-akpọ Mbugo n'Eluigwe nke Marịa, nke di n'ime nnukwu ụlọ ụka nke Pita dị asọ. Onye na-achọ ịnwụ anwụ
gụrụ Ekpere ndị a,ma ọ bụ nụ ka a gụrụ ha, ga-enweta indolịgensi narị
afọ anọ, nke bụ ụbọchị ole kwesịrị ka ọ taa ahụhụ ọbụla gụrụ Ekpere a, ma ọ bụ onye nụrụ ka a gụrụ ya, mara oge onwụ ya. Amen."