Ekpere Iji Meri Oru nke Ekwensu
O Chukwu Nna dị Ebeebe, n'ịdịko n'otu nke Nnwa Gị bụ Chukwu na Chukwu Mmụọ
Nsọ, na site n'Obi Marịa kasị ọcha, arịọ m Gị ka I mebie ike nke nnukwu
ndị iro Gi bụ ndị ajọ mmụọ.Zịga ha n'ime ala ọkụ mmụọ ma tụọ ha mkpọrọ
ebeebe.Weghara Alaeze Gị ahụ nke I kere, nke bụ nke gị n'ezie.
Nna nke eluigwe, meenu ka Obi Jesu dị asọ na Obi Marịa kasị ọcha chịba
anyị. N'ihi ịhụnaanya zuru oke m nwere n'ebe I nọ ka m ji ekpegharị
ekpere a oge ọbụla obi m tiri eti na oge ọbụla m kuru ume. Amen.