EKPERE NDỊ A NA ARỤ ỌRỤ DỊKA ỤZỌ NKE OBE
Ekpere nke Mbụ
Nna Anyị Nọ n'Eluigwe-Ekele Marịa
O Jesu Kristi! Ngị bụ obi ụtọ dị ebeebe nke ndị hụrụ Gị n'anya; Anụrị kacha
anụrị niile na ihe ọchichọ niile.
I bụ Nzọpụta na Olileanya nke ndị njọ niile. I gosipụtala na ọ nweghị ihe
I chọrọ karịrị ịnọnyeere ndị mmadụ,
ọbụladị ịwere ụdị mmadụ ka oge zuru, maka ịhụnaanya I nwere n'ebe mmadụ nọ.
Cheta ahụhụ niile Į nagidere site na mgbe
a tụụrụ ime Gị, ma ọ kachasị n'oge Ahụhụ na ọnwụ Gị, dịka nzube
Chukwu siri wee dị site na mgbe ebighi ebi.
nọ n'Oriri Ikpeazụ, I sachasịrị ha ukwu Wwee nye I kasiri ha obi, ma
kwuputakwa maka Ahụhụ na ọnwụ Gị nke na-abịanụ.
Chetakwa obi mwute na obiilunke juputara mkpụrụ obi Gị mgbe Gị onwe Gị
gbara akaebe si,“Mkpụrụobi m juputara namwute ọbụladị n'ọnwụ."
Dinwenu, tupu nnukwu ahụhuụ ahụ ị tara oge a kpodoro Gị n'obe, ka
I kpesịrị ekpere ugboro atọ,cheta egwu niile, oke ịhe mgbu nke obi
na ụfụ niile nke ị nwetara n'anụ ahụ Gị na-esighi ike oge ahụ I
juputara n'ọsisọ nke obara. Nwaazụ Gi bụ Jụdas rapụtara Gi.
Ndi akaebe asi boro Gi ebubo, tinyeere ndi okaikpe ato kpere Gi ikpe
ezighi ezi. Ihe ndi a mere oge Į nọ n'uju okorobia Gi, n'ime oge oriri
Ngabiga.
Cheta na oge a tọnahụrụ gi akwa Gị ha yibere Gị nke ịkpa ọchi.
Chetakwa na e ji akwa kechie ihụ na anya Gi; e tiri Gị ihe, e kpubere Gị
okpu ogwu,
a kpanyere Gị osisi n'aka. Cheta na a mara Gị ụra, ma nyekwa Gị mkparị dị
icheiche.
Na ncheta ụfụ niile na ahụhụ niile ndị a nke ịnagidere tupu Ahụhụ na ọnwụ Gị
n'elu Obe, mee tupu ọnwụ m ka mụ nwee ezinchegharị,jee nkwuputa ziri ezi
na nke zuru oke, ma meekwa ọpịpịa kwesịrị ekwesị wvee nata mgbaghara njọ
m niile.Amen.
Ekpere nke Abụọ
Nna Anyị Nọ n'Eluigwe-Ekele Marịa
O Jesul Ezi nnwere onwe nke ndị mmụọọma,alaeze nke ọnụ dị ukwuu. Cheta
oke egwu na obi mwute nke ị nagidere mgbe ndị iro Gị gbara Gị
gburugburu dika agụ ndọgbu, ha jiiri obi ha niile taa Gị ahụhụ site
na puku kwuru puku mkparị,asọ, ụra, mmerụahu na ọtụtụ ajọ ịhe ndị
ọzọ ekwughi ekwu. N'iche maka ahụhụ na okwu mkparị niile ndị a, ana mụ arịọ
Gị, O Onye nzọpụta m, ka ị gbapụta m n'aka ndị iro m niile,
ndị a hụrụ anya ma ndị ahụghi anya. Meekwa ka m nogide na nchekwa Gị
wee zuo oke maka nzọpụta ebeebe. Amen.
Ekpere nke Atọ
Nna Anyị Nọ n'Eluigwe-Ekele Marịa
O Jesu! Onye kere eluigwe na ala, Onye ihe niile di n'okpuru ya. Onye sitere
n'ike nke ịhụnaanya ya wee na-ejikọta ịhe niile. Chetakwa oke ụfụ ahụpụrụ
iche nke ị nwetara oge ndị Juu jliri nnukwu ntu na-apịghị onụ, nke ha
kuru ugboro ugboro,wee kpodo aka na ukwu Gị dị asọ n'Obe.
Na-ahughị Gị n'onodụ ịmeere ebere nke zuuru ha iji meda iwe ha,
ha bawanyere ọnya Gị, tinye ụfụ n'ime ụfụ, jiri obi ọjọọ gbatịa ahụ
Gị n'obe bịa dọọ Gi n'akuku niile nke mere ka aka na ụkwụ Gị pụọ n'ọnọdụ ha. Ario m Gị, O Jesu, n'icheta Ahụhụ a I
atụ Gị egwu na iji na-ahụ Gị n'anya. Amen.jị ịhụnaanya taa n'elu Obe,
nye mamara iji n'anya. Amen.
Ekpere nke Anọ
Nna Anyị Nọ n'Eluigwe-Ekele Marịa
O Jesu Dibia sị n'Eluigwe, Onye e welitere n'elu e-apa ọnya niile nke ị
natara, akụkụ ahụ Gị nille the ufu dị otu a adibeghị n'ahụ Gị.
Site n'opu isi Gi ruo n'ala ụkwụ Gị, o dịghị otu ebe n'ahụ Gị nke anọghị
n'oke ụfụ. A bịazịa, n'ịchezọ ahụhụ Gị niile, I kwụsịghị iriọ
Nna Gị nke Eluigwe arịrịọ maka ndị iro Gị mgbe ị na-asị,
“Nna gbaghara ha n'ihi na ha amaghị ịhe ha mere."
Site na nnukwu Ebere a, na ncheta nke ahụhụ a,mee ka ncheta Ahụhụ na ọnwu Gị
di oke mwute tinye n'ime anyị ịnwe nchegharị zuru oke na
ịnweta mgbaghara njọ anyị niile. Amen.
Ekpere nke Ise
Nna Anyị Nọ n'Eluigwe-Ekele Marịa
O Jesu! I bụ Ugegbe na-egosi ịdịmma dị ebeebe.Chetakwa mwute ahụ I nwere oge I no n'ime ihie nke abụm Chukwu Gi weena-eche echiche banyeere ndi ahụ
edegoro na-aga-esite n'erere aka ahụ, I hụkwara nnukwu igwe mmadụ ndị a
nabataghị, ndị ga-ata ahụhụ ebeebe maka njọ ha. Ma, site n'obi mwute,
I kpesakwara maka ndị njọ ahụ furu efu, na-enweghị oke,
ma ọ bụ olileanya. Site n'obi mmetụta a na-enweghị ọgwụgwụ, ma ọ kachasị
site n'eziomume nke I gosiri ezigbo onye ori ahụ
mgbe I siri ya:“Taa,I ga-anonyeere Mụ na Paradaịs,” arịọ m Gị, O Jesu dị
ụtọ, ka I gosi m ebere n'oge ọnwụ m. Amen.
Ekpere nke Isii
Nna Anyị Nọ n'Eluigwe-Ekele Marịa
O Jesu! Ezigbo Eze kwesiri ekwesị a hụrụ n'anya,cheta oke mgbu nke obi nke
I nwetara: oge I gba ọtọ, a kpodoro Gị ma welitekwa Gị
n'obe dịka onye ori nkịtị; oge ndị ikwu na ibe Gị na ndị enyi Gị gbahapụrụ
Gị, ma beelụ sọ Nne Gị Į hụrụn'anya bụ onye nọdebere Gị
oge Į nọ na nnukwu ahụhụ. I tinyere nchekwa ya n'aka nwaazụ Gị kwesịrị
ntụkwasị obi oge I gwara Marịa,“Nwaanyị, lee nwa gị," gwaakwa
Jonụ sị “Nnwa,lee nne gị."
Siten'obimwute ahụ dịka mmaagha nke mawara mkpụrụ obi Nne Gị dị asọ, arịọ m
Gị, O Onye nzọpụta m, ka I meere m ebere na nsogbu m niile,
ma nke ahụ ma nke mmụọ, nyeere mụaka n'ọnwụnwa mu niile, ma ọ kachasị
n'oge ọnwụ m.Amen.
Ekpere nke Asaa
Nna Anyị Nọ n'Eluigwe-Ekele Marịa
O Jesu! I bụ Jesu! I bụ Isiyi nke obi ebere na-enweghị ọgwụgwụ. Onye
gosipụtara ịhụnaanya sitere nala akpo m nkụ." Agu nzọpụta nke mmadụ
niile bịara Gi n'obi. Arịọ m Gị, O Onye nzọpụta m, mee niile na-anụ anyị
ọkụ n'obi. Ma wepụ n'ime anyị agụụ ime njọ ruru inyi nke anụ ahụ
na oke ọchịchọ ihe nke ụwa. Amen.
Ekpere nke Asatọ
Nna Anyị Nọ n'Eluigwe--Ekele Marịa
O Jesu! I na-enye mmụọ anyị oke ọnụ: I bụ obi ụtọ anyị. N'ihi ịhụnaanya
I nwere n'ebe anyị nọ,I suturu mmanya ilu ahụ bụ Vịnịga na Gọl
ọnụ oge I no n'elu obe. Site n'idi ilu nke mmanya ahụ,nyenụ anyị amara
itosi etosi ịnata Ahụ na ọbara Gị kasị oke ọnụ n'oge ndụ anyị na n'oge ọnwụ
anyị, ka ha rụọrụ makpụrụ obi anyị ọrụ dịka the mmezi na ịhe nkasị obi. Amen.
Ekpere nke Itoolu
Nna Anyị Nọ n'Eluigwe-Ekele Marịa
obi anụrị anyị. Oge I na-abịadebe ọnwụ nsọ,
cheta ịhe mgbu ahụ nke I nagidere mgbe I bamiri n'ime osimiri nke ahụhụ.
Ndị Juu kparịrị Gị, ha kpasuru Gị iwe. I jiiri oke olu tie mkpu,
“Chukwu m, Chukwu m, gịnị kpatara I jiri gbahapụ m?"
Arịo m Gị, O Onye nzọpụta m, site n'oke ahụhụ Gị a, agbahapụla m
n'ime egwu na ụfụ nke ọnwụ m.Amen.
Ekpere nke Iri
Nna Anyi Nọ n'Eluigwe-Ekele Maria
O Jesu! Onye bu mbido na njedebe nke ịhe niile,Ndụ na Eziomume. Cheta na
ọ bụ n'ihi anyị ka e jiri tukpuo Gị n'ime ahụhụ
enweghị njedebe site n'ala ukwu ruo n'opu isi Gị. Na ntụre nke ọnya Gị
karịrị akarị, kuziere m iji ịhụnaanya zuru oke na-edebe iwu Gị,
nke ụzọ ya dị obosara na mfe n'ebe ndị hụrụ Gị n'anya nọ. Amen.
Ekpere nke Iri na Otu
Nna Anyị Nọ n'Eluigwe-Ekele Marịa
O Jesu! Ngị bu Ebere miri emi na-enweghi njedebe. N'icheta ọnya Gị nke
bamiri n'ime ụmụ okpukpu Gị na n'ime ndụ Gị, arịọ m Gị ka I wezuga m na njọ,
mụ bụ onye njọ nọ na mkpa,njọ m megara mere m adịghị ike. Zoo m ka m
ghara ịhụ ihu Gị nke were iwe ziri ezi maka m.
Zobe m n'ime apa ọnya Gị ruo mgbe iwe Gị ziri ezi gafesiri.Amen.
Ekpere nke Iri na Abụọ
| Nna Anyị Nọ n'Eluigwe-Ekele Marịa
O Jesul Ugegbe na-eziputa eziokwu. I bụ akara igwe ọnya ahụ nke juputara
n'Ahụ Gị niile, site n'isi ruo n'ụkwụ. E sewasịrị Ahụ
Gi ma mee ya ọbara ọbara site n'ikwafu ọbara Gị kasị oke ọnụ.O Ahụhụ dị
Ukwuu zuru Ebe niile nke I ji n'ihi ịhụnaanya I nwere n'ebe anyị
nọ nara n'Ahụ
Gị na-emerughị emeru.
Jesu kasị dị ụtọ! Kedu ịhe ahụ nke I nwere ike imeere anyị, I mebeghị!
Meenụ, site n'iji okwukwe na-echeta Ahụhụ na ọnwụ Gị, ka mkpụrụ nke ahụhụ
I tara na-adị ọhụrụ n'ime mkpụrụ obi m. Ka ịhụnaanya Gị na-abawanye
n'ime obi m kwa ụbọchị ruo mgbe mụ ga-ahụ Gị ịhu na ihu.
O Jesu kasị dị Ụtọ, Ngị bu Ụlọaku nke ihe niile kasị dị mma na añụrị
niile, nke m rịọrọ ka I nye m n'eluigwe. Amen.
Ekpere nke Iri na Atọ
Nna Anyị Nọ n'Eluigwe-Ekele Marịa
O Jesu! Agụ siri ike,I bu Eze adịghị anwụanwụ nke a na-emeri Gị emeri.
Mgbe Ike Gi niile gwụsịrị kpamkpam, ma nke mmụọ ma nke ahụ,cheta ahụ ụfụ nke Į nagidere n'oge ahụ.
I hụnatara Isi Gị sị, “O zuola.” Dinwenụ Jesu, arịọ m Gị ka I site na
nnukwu ahụhụ a na oke obi mgbu a mere m ebere n'oge ọnwụ m,
mgbe mmụọ mụ ga-anọ na nnukwu nsogbu, na mgbe mkpụrụobi m ga-anọ n'oke ụfụ.
Amen.
Ekpere nke Iri na Anọ
Nna Anyị Nọ n'Eluigwe-Ekele Marịa
O Jesu! I bụ so otu Nnwa nke Nna, Onye dị n'ụdị Nna dị, cheta etu ahụ
I si jiri umeala nyefeere Nna Gị dị Ebeebe Mkpụrụ obi
Gi mgbe I siri,“Nna, n'Aka Gị ka m nyefere mmụo m” E sewasịrị Ahụ Gị
niile; Obi Gị tịwara! E meghere Ebere Gị ahụ dị omimi ka o zopụta anyị.
I nwụrụ!O Eze ndị Nsọ! Arịo m Gi, site n'ọnwụ a kasị oke ọnụ, ka ị kasie m
obi bịa nyeere m aka ịjụ ekwensu, anụ ahụ, na ụwa.
Ka ọ ga-abụ m nwuọrọ ụwa, ka m wee dịrị naanị Gị ndụ. Arịọ m Gị
ka Į nabata m n'oge ọnwụ m, dịka onye njem na onye a chụpụrụ
n'obodo ya na-alakwute Gị.Amen.
Ekpere nke Iri na Ise
Nna Anyị No n'Eluigwe-Ekele Marịa
O Jesu! Ezi Vaịn ahụ na-amịta mkpụrụ. Cheta na o masịrị Gị ịsị n'ahụ Gị dị
asọ gbafuo ọtụtụ ọbara,
dịka mmiri Grepu sị n'ihe e ji apị mmanya ọkụ apụta.
Site n'akụkụ Gị onyeagha ji ubemapụo,ọbara na Gị, ọbụladị otu ntupu.
Anụ Ahụ Gị na-esighi ike,nke dịka osisi mgbaisi ọma ebugoro
n'elu obe,ka e mebiri n'ikpeazu. Ihemebereahụ Gị kpọnwụrụ, ụmị ọkpụkpụ Gị
kpọrọ nkụ.
O Jesu dị Utọ, site n'Ahụhụ na ọnwụ Gị a dị oke gbafuru, arịọ m Gị ka Į
nara mkpụrụobi m oge m ga-ano n'oke ufu nke ọnwụ m. Amen.
Na Mmechi
Mawaa obi m, O Jesu dị Utọ, ka anyammiri nke ọpịpịa m na-eme maka njọ mụ
na agụụ ịhụ Gị n'anya bụrụ nrị m, ehihie na abalị.
Mee ka m bụrụ Gi onye a tọghatara atọghata n'enweghizi ila azụ. Ka obi
m bụụrụ Gi ebe obibi di ebeebe,ka okwu m niile na-amasi Gi,
ka ndụ m kwesi otito n'isi njedebe ya ka m wee keta eluigwe, bụ ebe m na ndi nso Gi ga na-eto Gi mgbe niile.Amen.
Jesu,Marịa, ahụrụ m unun'anya,zọpụtanụ mkpụrụobi niile.