EKPERE IRI NA ISE ONYENWANYỊ JESU KRISTI KUZIIRI BRIJETỊ DỊ ASỌ
Nkwa Ahụ Bụga:
1. Aga M esite na Pọgatrị zọpụta mkpụrụobi iri na ise, bụ ndị metụtara onye ahụ na-ekpe ekpere a.
2. Mkpụrụobi iri na ise ndị metụtara onye ahụ ka a ga-eji amara chekwaba ma meekwa ka ha zuo oke.
3. Ndị ọmenjọ iri na ise metụtara ya ka a ga-atọgha.
4. Onye ọbụla na-ekpe ekpere ndị a ga-eruriri n'ọkwa mbụ nke ịdị asọ.
5. O fọdụ ụbọchị iri na ise tupu onye na-ekpe ekpere a anwụọ, aga Mụ enye ya Ahụ Mụ dịoke ọnụ ka o rie, ka ọ wee gbanalị agụụ dị ebeebe. Aga M enyekwa ya Obara M dị oke
onụ ka o nụo, ka akpịrịgharaịkpo ya nkụ ebeebe.
7. Aga M akwụba akara nke Obe ahụ wetaara gbaara ya ọgụ ndị iro ya.
8. Aga M eji afọọma nara mkpụrụobi ya ma dugakwa ya n'ime anụrị dị ebeebe.
9. Site n'isiiyi nke abụm Chukwu M, aga M enye ya ịhe ọnụnụ pụrụ iche oge ọ nọ n'ime anụrị dị ebeebe. Agaghị M emeere ndị ekpeghị ekpere M udiri ịhe a.
10.0 dị mkpa imata na Onyenweanyị ga-agbaghara ọbụladị onye nọgoro n'ime nnukwu njọ afọ iri atọ, njọ ya niile, ma ọ bụrụ na onye ahụ ga-ekpe ekpere ndị a site n'ịwepụta oge na n'iche echiche banyeere ha n'ime obi ya.
11.Aga M echekwaba onye ahụ n'ọnwụnwa niile siri ike.
12.Aga M edokwa ma chekwaa ihe ise ahụdị n'ahụ ya e ji ama ịhe na-emenụ, ka ha ghara imi, anụahụ na ire ya.
14.A ga-azọpụta mkpụrụobi onye na-ekpe ekpere a n'ọnwụ ebeebe.
15.O ga-enweta the niile ọ rịọrọ n'aka Chukwu
16.O bụrụ na oge ọnwụ ya dị nsọ, a ga-eme ka o bikwuo ndụ, ma ọ bụrụ na o biri ndụ ya niile n'ime uche aka ya.
17.Oge ọ bụla mmadụ na-ekpe ekpere ndị a ọ ga-enweta įndọlịgensị otu narị ụbọchị.
18.A na-ekwe onye ahụ nkwa isonye n'otu ndị mmụọọma nke eluigwe.
19.Onye ọ bụla na-akuziiri mmadụ ekpere a ga-enweta anụrị na erere na-adigide ebeebe.
20.Chineke ji amara ya nọrọ n'ebe ọ bụla a na-ekpe ekpere ndị a, ma ọ bụ ebe a ga-ekpe ha n'ọdịniihu.