AHỤ NA ỌBARA KRISTI KACHASỊ NSỌ

MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NNUKWU MMEMME PỤRỤ ICHE
AHỤ NA ỌBARA KRISTI KACHASỊ NSỌ
MKPỤRỤ DỊ ICHEICHE NKE YUKARỊSTỊA KACHASỊ NSỌ
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Onye, mgbe Ya na ndị Apọstụl Ya nọ n'oriri ikpeazụ,
iji were mee ka ihe ncheta nke obe
na-azọ ndụ digide ebighịebi,
jiri Onwe Ya chụnyere Gị aja,
dị ka Nwaatụrụ na-enweghị ntụpọ,
nke Ị nabatara ka aja otito zuru oke.
N'iheomimi nke a dị ebube, I na-edo ndị kwere na Gị nsọ
mgbe Ị na-azụ ha nri,
ka otu ìhè nke okwukwe
wee chakwasa agbụrụ mmadụ zuru ụwa ọnụ,
otu ịhụnanya ejikọtakwa ha.
N'ihi ya, anyị na-esonye n'oriri Amansọ a dị oke ịtụnanya,
ka ọ ga-abụ, amara Gị dezuo anyị ahụ,
anyị agbanwoo dị n'oyiyi ụdị nke eluigwe.
N'ihi nke a,
eluigwe na ụwa jikọrọ ọnụ
were ukwe ọhụrụ na-esekpụrụ Gị,
anyị na igweagha ndị Mmụọọma niile,
na-etiku Gị akwụsịghị akwụsị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
N'ihi nke a,
eluigwe na uwa jikoro onụ
were ukwe ohurų na-esekpuru Gi,
anyi na igweagha ndi Mmuooma niile,
na-etiku Gi akwusighi akwusi na-asi:
Nso, Nso, Nsọ Oseburuwa Chineke nke igwe ndi agha...