Were Aka M O Nne Dị Ngọzị
Were aka m O nne dị Ngọzị Jidesie mụ ike ka m ghara ịda
Egwu na-atu mụ oge m na-aga ije
Ma ngị bu onye m ji umeala akpọku
Nyeere mu aka oge ọ bula m choro
Igafere n'akuku nke ọzọ
Chekwaba mụ oge m na-esi n'ọnọdụ m nọ na ya
agafere n'ọnọdụ ọzọ
Mee ka m mara na Į nọ n'akụkụ m
Na-ege nti n'ekpere m ji obi m niile ekpe
Duga m n'ebe m na-aga kwa ubọchị
N'enweghị nsogbu ọbula
Nyeere mụ aka n'ihe ọ bula m na-eme
Ka oge na-agafere
Ma oge mgbede dabidoro anyị
Egwu na-atụ m ịnọ soọsọ mụ
Were aka m, O Nne dị Ngọzị
Ma chekwaba mụ na ezinaụlọ m.