Nkwa Nke Iri na Ise Vejin Marịa Kwere Ndị Òtù Kristi Na-ekpe Rozarị
1. Onye ọbụla ga-akwudosi ike were ikpe rọzarị na-asọpụụrụ m ga-enweta amara pụtara ihe.
2. Ana mụ ekwe ndị niile ga-ekpe rozarị nkwa ịnweta nchekwa m pụrụ iche tịnyeere amara nke kachasinụ.
3. Rọzarị ga-abụ ịhe ga-enye nchekwa siri ike n'ebe ọkụmmụọ dị. O ga-emebi ajọọmume bịazị mee ka njọ benata. Rọzarị ga-eme ka nkuzi asị ghara įdizi ire.
4. Rọzarị ga-ewetaara mkpụrụobi ndị mmadụ ebere nke Chukwu n'ebe ọ dị ukwuu,biazi mee ka eziomume na eziọrụ na-abawanye.Rọzarị ga-ewepụ n'ime obi ndị
mmadụ,ịhụnaanya ahụ nke ha nwere n'ebe ụwa dị, na ihe diga n'ime ya n'enweghị isi, bia welite obi ha n'inwe agụụ maka ihe nke dị ebeebe. Ndị
mmadụ pụrụ isite n'ụzọ dị etu a nweta ịdị asọ nke ha.
5. Onye ọbụla nyere mụ onwe ya site n'ikpe rọzarị agaghị ala n'iyi.
agaghị anwụ anwụ na-adịghị nkwadobe.Chineke agaghị ata onye ahụ ahụhụ n'ihi ikpe nkwụmọọtọ ya. O bụrụ na ọ na-eme ezigbo omume, ọ ga-anọgide
n'amara Chineke,nke ga-eme ka o tosi etosi ịnweta ndụ ebeebe.
7. Onye ọbụla ga-eji obi ya niile na-ekpe rọzarị ga-anatarịrị sakramentị ahụ ga Uka na-enye tupu ọ nwụọ.
8. Chịneke ga-enye ndị niile kwudosiri ike na-ekpe rọzarị ihe ya na ụba amara ya. Nke a ga-abụ oge ha dị ndụ na oge ha ga-anwụ. Ọbụru na ha nwusịa,
ha ga-esonye ozigbo n'erere ndị nsọ na Paradaịs.
9. Aga m azọpụta ndị niile na-ekpe rọzarị nke ọma na pọgatrị.
10.N'eluigwe, ndị bụ ezigbo umu nke rọzarị ga-enweta ebube di elu.
11.Site n'ikpe rọzarị, ị ga-enweta ihe niile i rịọrọm.
12.Aga mụ enyeere ndi niile na-enye aka igbasa rọzarị aka na mkpa ha niile.
13.Ndị niile na-arịọ arịrịọ site na rọzarị ga-enwe ike niile nke eluigwe dịka ndị ga na-arịọtaara ha arịrịọ, oge ha dị ndụ na oge ha ga-anwụ.
Nke a bụ ịhe m natara n'aka Nnwa m, bụ Chukwu.
14.Ndị nille na-ekpe rọzarị bụga ụmụ m. Ha bụkwa umunne so otu Nnwa m, Jesu Krist.
15.Ịdị na-enye oge maka rozarị mụ bụ nnukwu akara na-egosi mkpụrụ a ga-azopụta