IFE NKE KPAKPANDO
1. Ife nke kpakpando
Nne nso nke Chukwu
Nwaanyị na-alụghị alu
Onụụzo nke eluigwe
2. Ubochị I kwenyere
Okwu mmuoozi Chukwu
I kpatara n'uwa
Ngoziga nke ndọkwa
3. Kpopụrụ anyị ọgba
Were ife nye ndiisi
Wepụ njọ dịrị anyị
Yobara anyị Jesu
4. Gosi na I bụ nneanyị
Nara ekpere nke anyị
Chelụ n'ihu Jesu
Nnwa gị Chukwu nke anyị
5. Nwaanyị n'enweghị ube
kasị n'obi nwayọọ
Kuziere obi anyị
Ka ọ welụ sọọ Jesu
6. Ka anyị wee gaa n'ihu
Werụka ịhe dị egwu
anyị ga-ahụ Jesu
N'añụrị nke Chukwu
7. Ka anyị were oke olu
Ka etobe Dinwenu
Otito dịrị Nna
Na Nnwa na Mmụo Nsọ. Amen