LITANI NKE UMEALA
O Jesu dị nwayọọ dị obi umeala, nuru olu m
Site n'agụụ nke ịbụ onye a ga-ebuli elu
Site n'agụụ nke ịbụ onye a ga-ahu n'anya
Site n'agụụ nke ịbụ onye a ga-enye oke otito
Site n'agụụ nke ịbụ onye a ga-akwanyeere ugwu
Site n'agụụ nke ịbụ onye a ga-eto
Site n'agụụ nke ịbụ onye a ga-ahọrọ
Site n'agụụ nke ịbụ onye a ga-ajụta ihe
Site n'agụụ nke ịbụ onye a ga-anabata
Zoputa m, O Jesu
Site n'egwu nke ịbụ onye a ga-akpụ ugwu ya n'ala.
Site n'egwu nke ịbụ onye eweghi n'ihe.
Site n'egwu nke ịbụ onye a ga-ata ụta.
Site n'egwu nke ịbụ onaye a ga-ebo ebubo asi.
Site n'egwu nke ịbụ onye e chezọrọ echezọ.
Site n'egwu nke ịbụ onye a ga-eme onye nzuzu.
Site n'egwu nke ịbụ onye a ga-emejo.
Site n'egwu nke ịbụ onye a ga-atụ aka n'ịhe ọjọọ.
Zọpụta m, O Jesu
Na a ga-ahụ ndi ọzọ n'anya karia m.
Na a ga-enye ndi ọzọ oke otito karia m.
Na n'echiche nke ụwa, ka ndi ọzọ na-ebuwanye,ka m na-epelata.Na a
ga-ahọrọ ndi ọzọ, ma ewezụga m n'akụkụ.
Na a ga-eto ndi ozo, ma aburu mu onye a maghi na ọ nọ.
Na n'ihe nile, a ga-agụta ndi ozo dika ndi ka mma, karia m.
Na ndi ozo ga-akara m di asọ, ma o bụrụ na m dịasọ etu m kwesiri.
Jesu, nye mụ amara inwe agụụ nke.