Satọde Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Amos: 9:11-15
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 85:8, 10-11, 12-13
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMatiu: 9:14-17
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Amos: 9:11-15
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Amọs
“N’ụbọchị ahụ, aga m akwalite ụlọikwu Devid dara ada ma rụziekwa akụkụ ya niile dapịasịrị adapịasị. Aga m arụzikwa ya ma mekwaa ka ọ dị otu ọ dị na mbụ, ka ha nwee ike nwere ndị fọdụrụ n’Edọm ya na mba niile ndị a kpọrọ aha m,” Ọ bụ Yahweh mere nke a na-ekwu.
“Lee ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” Ọ bụ Yahweh na-ekwu, “mgbe onye na-akọ ugbo ga-agafe onye na-ewere akụkụ ubi, mgbe onye na-azọcha mkpụrụ vaịn ga-agafekwa onye na-akụ mkpụrụ ya, mgbe mmanya na-atọ ụtọ nke ukwuu ga-esi n’ugwu na-atapụta, sikwa n’ugwu nta niile na asọpụta.
Aga m enyeghachikwa ndị nke Izrel iheọma ha ga-eji arụzikwa obodo ha ndị dakpọrọ adakpọ, ma birikwa na ha. Ha ga-akọ ugbo vaịn ma ñụọkwa mmanya si na ya, ha ga-akọkwa ugbo ma riekwa mkpụrụ si na ya.
Aga m akụnyekwa ha, n’ala ha ka ọ ghara inwe onye ga-efopụ ha ọzọ n’ala ahụ m nyere ha,” ọ bụ Yahweh Chineke ụnụ na-ekwu.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 85:8, 10-11, 12-13
Azịza: Onyenweanyị na-ekwu okwu ụdo maka ndị nke ya
1. Ana m ege ntị n’ihe Chineke, Onyenweanyị na-ekwu,
ihe ọ na-ekwu bụ udo
maka ndị nke ya, ndị dị nsọ
ma ọ bụrụ na ha alaghachighị azụ na mmehie ha.
Azịza: Onyenweanyị na-ekwu okwu ụdo maka ndị nke ya
2. Ịhụnaanya na okwukwe amakụọla,
eziomume na udo ebiela ọma
Irubeisi ga-esi n’ala pulite,
eziomume ga-esi n’elu ledata anya.
Azịza: Onyenweanyị na-ekwu okwu ụdo maka ndị nke ya
3. Ee Onyenweanyị ga-enye anyị ọganiihu,
ala anyị ga-amịta mkpụrụ bawanye.
Eziomume ga-aga n’ihu ya
udo ga na-eso nzọ ụkwụ ya.
Azịza: Onyenweanyị na-ekwu okwu ụdo maka ndị nke ya
MBEKU – Ps. 119:34
Alleluia, Alleluịa:
Atụrụ M na-anụ olu M, ka Onye-nwe-anyị kwuru; Amaara m ha, ha na-esokwa M.
Alleluịa.
OZIỌMA –Matiu: 9:14-17
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
E mechaa, ụmụazụ Jọn bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere anyị na ndị Farisii ji ebu ọnụ ma ụmụazụ gị anaghị ebu ọnụ?
Jesu zara ha sị, “Ndị bịara oriri agbamakwụkwọ ha ga-anọ n’uru mgbe ha na nwoke na-agba akwụkwọ ka nọ? Oge na-abịa mgbe a ga-anapụ ha nwoke na-agba akwụkwọ, mgbe ahụ, ha ga-ebube ọnọ”.
O nweghị onye ga-ewere iperipe akwa ọhụrụ dụchie akwa ochie, n’ihina ọ ga-esi n’akwa ahụ dọkapụ, ndọka a ga-aka njọ. A naghịkwa agbanye mmanya ọhụrụ n’ime udu ochie.
E mee otu a, udu ahụ ga-agbawa, mmanya ahụ awụfuo, udu ahụ alakwaa n’iyi. Kama, a na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ime udu ọhụrụ, n’ụzọ dị otu a ka e si echekwa ha abụọ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu