Emume Barnabas dị Asọ – Nwaazụ.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Oru: 11:21-26; 13:1-3
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 98: 1, 2-3, 3-4, 5-6
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMatiu: 5:20-26
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Oru: 11:21-26; 13:1-3
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị ozi
Onyenweanyị nọnyekwaara ha, nke na ọtụtụ ndị kwerenụ chegharịrị. Akụkọ banyere nke a ruru nzukọ Kristi nke dị na Jerusalem ntị. Ha zigara Banabas n’Antiọk.
Discover more
Litany of the Blessed Virgin Mary
Mgbe ọ bịaruru hụ amara Chineke, obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu. Ọ rịọrọ ha niile ka ha were obi ha kwụsie ike n’okwukwe, nọgidesie ike n’ime Onyenweanyị.
Banabas bụ ezigbo mmadụ, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ na okwukwe na Dinwenụ. Banabas pụrụ gaba Tasus ịchọ Sọl; oge ọ chọtara ya, ọ kpọọrọ ya laghachi Antiọk.
Ha abụọ nọrọ n’Antiọk ihe karịrị otu afọ na-akụziri igwe mmadụ ihe. Ọ bụkwa n’Antiọk ka e bu ụzọ kpọọ ndị na-eso ya ‘Ndị otu Kristi.’ N’ime nzukọ Kristi nke dị n’Antiọk, e nwere ọtụtụ ndị amụma na ndị nkuzi.
Ndị a bụ Banabas, Simiọn, onye a na-akpọ Nịga, Lushiọs onye Sairiin, Manen bụ otu onye n’ime ndị obi Herọd, bụ onye na-achịrị ndị Rom obodo anọ, na Sọl.
Otu ụbọchị, ka ha nọ na-ekpe ekpere, na-ebukwa ọnụ, Mmụọ Nsọ gwara ha sị, ‘Wepụtaranụ m Banabas na Sọl iche, maka ịrụ ọrụ nke m kpọrọ ha ka ha rụọ.’ Oge ha kpechara ekpere, buchakwaa ọnụ, ha bikwasara ha aka n’isi zipụ ha.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 98: 1, 2-3, 3-4, 5-6
Azịza (V. 2): Onyenweanyị egosịla ike nzọpụta Ya
1. Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ
N’ihina Ọ rụrụ ọrụ ebube,
Aka nri Ya na aka Ya dị nsọ
e wetarala Ya mmeri.
Discover more
Litany of the Blessed Virgin Mary
Azịza : Onyenweanyị egosịla ike nzọpụta Ya
2. Onyenweanyị egosịla ike nzọpụta Ya
O meela ka mba niile mata eziomume Ya
O chetala ịhụnaanya Ya na ịkwụdosiike Ya
N’ebe ezinụụlọ Israel nọ.
Discover more
Litany of the Blessed Virgin Mary
Azịza : Onyenweanyị egosịla ike nzọpụta Ya
3. Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta nke Chineke anyị.
Ụwa niile tijerenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ
Werenụ ukwe na mkpu ọñụ too Ya,
Kweerenụ Onyenweanyị ukwe.
Discover more
Litany of the Blessed Virgin Mary
Azịza : Onyenweanyị egosịla ike nzọpụta Ya
4. Werenụ ụbọ akwara na ihe egwu dị icheiche
Tierenụ Onyenweanyị egwu!
Werenụ opi igwe na mpi
Kwupụta na Onyenweanyị bụ eze.
Discover more
Litany of the Blessed Virgin Mary
Azịza : Onyenweanyị egosịla ike nzọpụta Ya
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Ana m enye unu iwu ọhụrụ: hụrịtanụ onwe unu n'anya dị ka M hụrụ unu n'anya
ALLEUIA.
OZIỌMA – Matiu: 5:20-26
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jisọs sịrị ndị na-eso ụzọ Ya:
"M na-agwa unu, ọ bụrụ na eziomume unu esighị n’ike karịa nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, unu agaghị aba n’alaeze elu igwe.
"Unu anụwo na e kwuru nye ndị nna unu, 'Ị gaghị egbu mmadụ; onye ọ bụla gburu mmadụ ga-adịkwa mmehie ikpe.' Ma Mụ onwe m na-agwa unu, onye ọ bụla were iwe n’ebe nwanne ya nọ ga-adịkwa mmehie ikpe; onye ọ bụla kpọrọ nwanne ya, 'Raqa,' ga-aza ajụjụ n’ihu Sanhedrin; onye ọ bụla sịkwara, 'Onye nzuzu,' ga-adị mmehie na Gehena ọkụ.
Ya mere, ọ bụrụ na ị na-ebute onyinye gị n'ebe ịchụ àjà, ma cheta na nwanne gị nwere ihe ọ bụla megide gị, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ebe ịchụ àjà, buru ụzọ gaa gbanwee onwe gị na nwanne gị, ma mgbe ahụ bịa chụọ onyinye gị.
Mee ka ya na onye na-emegide gị kwekọọ ngwa ngwa mgbe unu nọ n'ụzọ na-aga ụlọikpe. Ma ọ bụghị ya, onye na-emegide gị ga-enyefe gị n’aka onye ikpe, onye ikpe ga-enyefekwa gị n’aka onye nche, a ga-atụbakwa gị n’ụlọ mkpọrọ.
Amen, a na m agwa gị, a gaghị ahapụ gị ruo mgbe ị kwụrụ penny ikpeazụ."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu