Fraịde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
2 Tim: 3:10-17
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 119: 157, 160, 161, 165, 166, 168
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMak: 12:35-37
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –2 Tim: 3:10-17
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi nke Abụọ Pọl degaara Timoti
Ugbu a, ị chọpụtala nkuzi m, omume m, ebumnuuche m banyere ndụ nke a, ndidi m, ịhụnaanya m na nkwụdosịike m.
Ị matakwara mkpagbu m na ahụhụ m niile, na ihe niile dakwasara m n’Antiọk, Aịkọnium na Listra, na mkpagbu niile dịịrị m, ma Onyenweanyị zọpụtara m na ha niile.
N’eziokwu, a ga-akpagbu ndị niile na-achọ ịdị ndụ dị asọ n’ime Jesu Kristi. Ma ndị ajọomume na ndị mpako ga na-aga n’ihu n’ịkwanye njọ na ajọomume ha.
Ha na-eduhie ndịọzọ, ndịọzọ na eduhie ha. Ma gị onwe gị, nọgidesieike n’ihe ị mụtara na ihe i kwenyesiri ike na ya, ebe ị maara onye i si n’aka ya mụta ha.
Ị maara na ọ bụ site n’oge ị bụ nwata ka ihe e dere n’akwụkwọ nsọ doro gị anya, nke nwere ike ikuziri gị maka nzọpụta site n’okwukwe i nwere na Jesu Kristi.
Ihe niile e dere n’Akwụkwọ nsọ si na mkpalite nke Chukwu. Ha bakwara uru iji na-akuzi ihe, ịgwa mmadụ mmehie ya, ịgbaziri na inye ọzụzụ na ndụ eziomume.
N’ụzọ dị otu a onye nke Chukwu ga-ezuoke dị nkwadebe maka ezi ọrụ ọbụla.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 119: 157, 160, 161, 165, 166, 168
Azịza: Ndị niile hụrụ iwu gị n’anya nwere udo.
1. Ha dị ọtụtụ bụ ndị na-emegbu m, na ndị na-ebuso m agha,
mana anaghị m ahapụ iwu gị.
Azịza: Ndị niile hụrụ iwu gị n’anya nwere udo.
2. Okwu gị niile bụ eziokwu,
iwu gị niile ziri ezi na-adị ebeebe.
Azịza: Ndị niile hụrụ iwu gị n’anya nwere udo.
3. Ọ bụ ezie na ndị ọchịchị na-emegbu m n’enweghị ihe m mere ha.
mana obi m nọsiri ike n’ịtụrụ gị egwu.
Azịza: Ndị niile hụrụ iwu gị n’anya nwere udo.
4. Ndị niile hụrụ iwu gị n’anya nwere udo,
o nweghị ihe ga-eme ka ụkwụ kpọọ ha.
Azịza: Ndị niile hụrụ iwu gị n’anya nwere udo.
5. Enwere m nchekwube na-nzọpụta gị, O Onyenweanyị,
na-emekwa ihe i inyere n’iwu.
Azịza: Ndị niile hụrụ iwu gị n’anya nwere udo.
6. Ana m edobe iwu gị na nkuzi gị niile,
n’ihina ị maara ụzọ m niile.
Azịza: Ndị niile hụrụ iwu gị n’anya nwere udo.
MBEKU – Eph 1:17-18
Alleluia, Alleluia:
Onye ọ bụla hụrụ M n’anya ga-edebe okwu m. Nna M ga-ahụ ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya.
Alleluia.
OZIỌMA –Mak: 12:35-37
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Mgbe Jesu na-akụzi ihe n’ụlọnsọ Chineke, ọ jụrụ sị, “Olee otu ndị odeakwụkwọ ji ekwu na Kristi bụ nwa David?
David n’onwe ya site na mkpalite nke Mmụọ Nsọ kwuru sị, “Onyenweanyị gwara Nna m ukwu, Nọdụ ala n’aka nri m, Ruo mgbe m ga-edote ndịiro gị n’okpuru ụkwụ gị.
David n’onwe ya kpọrọ ya Nna ukwu, olee ka ọ ga-esi bụrụkwa nwa ya? Ya mere oke igwe mmadụ nọ n’ebe ahụ ji ọñụ nụrụ okwu ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu