Emume Ncheta Nrọgoro N’Eluigwe nke Onyenweanyị
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Oru: 1:1-11
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 46:2-3, 6-9 Az. 6
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Efesos 1:17-23
- OziọmaLuk: 24:46-53
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Oru: 1:1-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi
Ezigbo Tiofilọs! N’akwụkwọ nke mbụ, e dere m ihe banyere ihe niile Jesu mere na nke Ọ kụziri, site n’oge Ọ malitere ọrụ Ya, ruo ụbọchị Chineke naara Ya n’eluigwe.
Ma tupu Jesu arịgoo n’eluigwe, O sitere n’ike Mmụọ Nsọ kuziere ndị ahụ Ọ họpụtara, bụ Ụmụazụ Ya, ihe omimi dị iche iche. Mgbe Ọ hụsịrị ahụhụ ọnwụ, O gosiri mmadụ ndị a onwe Ya iri ụbọchị anọ, n’ụzọ dị iche iche na-adịghị na ngọfu, na O biliela; na Ọ dị ndụ.
N’oge a, Jesu nọ na-akuziri Ụmụazụ ya ihe banyere Alaeze Chineke. Mgbe Ya na ha zukọrọ, O nyesiri ha iwu ike, sị: “Ụnụ esikwala na Jerusalem pụọ ugbu a!
Kama cherenụ nkwa nke Nna, nke ụnụ nụrụ n’ọnụ M! Ụnụ ma na Jọn jiri mmiri mee ndị mmadụ mmirichukwu, ma Chineke ga-eji Mmụọ Nsọ mee ụnụ mmirichukwu n’oge na-eteghị aka.
Ya mere, mgbe ndị Ụmụazụ ahụ gbakọrọ, ha wee jụọ Jesu, sị: “Onyenweanyị, ọ bụ n’oge a ka Ị ga-enyeghachi Izrel alaeze?” Jesu wee sị ha: “Ọ bụghị ihe dịịrị ụnụ ịma oge, ma ọ bụ ụbọchị, nke Nna M debere n’ike nke aka Ya.
Kama ụnụ ga-anata ike mgbe Mmụọ Nsọ dakwasịrị ụnụ. Ụnụ ga-abụkwa ndị akaebe M n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria niile, rukwaa ebe ụwa sọtụrụ.”
Mgbe Jesu kwusiri okwu ndị a, mgbe ndị Ụmụazụ ahụ nọ na-ele anya, e wee welie Jesu elu; igwe ojii wee kpuchie Ya, zopụ Ya n’anya ha. Ha wee legide anya n’elu ka Ọ na-aga.
Ma mgbe ha na-ele anya, na mberede, ndịikom abụọ yi uwe ọcha guzoro ha nso, sị: “Ndị Galili! Gịnị mere ụnụ guzo n’ebe a, anya n’eluigwe! Jesu nke a, Onye a napụrụ ụnụ rịgooro n’eluigwe, ga-abịakwa ọzọ, otu a ụnụ hụrụ Ya ka Ọ na-arịgo n’eluigwe.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA –Ps: 46:2-3, 6-9 Az. 6
Azịza: Chineke ji mkpu ọñụ arọgo n’oche eze Ya. Gbuoronụ Onyenweanyị opi ike. Ma ọ bụ Aleluya
1. Ụnụ niile, kụọnụ aka. Tierenụ Chineke mkpu ọñụ.
N’ihi na Onyenweanyị, Onye kacha elu, onye dị ebube bụ eze kacha eze niile.
Ọ bụ nnukwu Eze na-achị ụwa niile.
Azịza: Chineke ji mkpu ọñụ arọgo n’oche eze Ya. Gbuoronụ Onyenweanyị opi ike. Ma ọ bụ Aleluya
2. Ọ bụ n’ụzụ mkpu ọñụ ka Chineke na-arọgo n’oche eze Ya.
Ọ bụkwa n’ụda opi ike ka Ọ na-agbago.
Kweerenụ Chineke ukwe otito. Kweenụ ukwe otito.
Kweerenụ eze anyị ukwe otito. Kweenụ ukwe otito.
Azịza: Chineke ji mkpu ọñụ arọgo n’oche eze Ya. Gbuoronụ Onyenweanyị opi ike. Ma ọ bụ Aleluya
3. N’ihi na Chineke bụ Eze na-achị ụwa niile.
Bụọnụ abụ otito.
Chineke bụ eze na-achị mba niile.
Chineke nọdụrụ n’oche eze Ya dị nsọ.
Azịza: Chineke ji mkpu ọñụ arọgo n’oche eze Ya. Gbuoronụ Onyenweanyị opi ike. Ma ọ bụ Aleluya
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ –Efesos 1:17-23
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi nke Pọl dị asọ degaara ndị Efesọs
A na m arịọ Chineke nke Onyenweanyị Jesu Kristi, bụ Nna nke ebube, ka O nye ụnụ Mmụọ nke amamihe na nke mkpughe; ka O kpugheere ụnụ ihe niile banyere Chineke; ka ụnụ wee mara Ya.
Ana m arịọkwa ka Chineke meghee anya nke obi ụnụ, ka ụnụ wee hụ ihe, mata ihe bụ olile anya nke dị n’ọkpụkpọ Ọ kpọrọ ụnụ; matakwa ụdị akụ nke nkwa ahụ dị ebube, nke O kwere ndị nsọ Ya; matakwa na nnukwu ike Ya na-enweghị atụ, na-arụsi ọrụ ike n’ebe anyị bụ ndị kwere ekwe nọ.
Ike a Chineke na-etinye n’ime anyị bụ otu ike ukwu ahụ, O jiri mee ka Kristi si na ndị nwụrụ anwụ bilie, mekwaa ka Ọ nọdụ n’aka nri nke ike Ya, n’ebe kachasị elu nke eluigwe.
N’ebe ahụ ka Kristi nọ, bụrụ isi, na-achị ọchịchị niile, na ịbụ isi niile, na ike niile, na ịbụ Onyenwe mmadụ, na aha niile ụmụ mmadụ na-ehota, na-asọpụrụ, ma n’ụwa nke a ma na nke gaje ịbịa.
Chineke doro ihe niile n’okpuru ụkwụ Kristi, were Ya nye ka Ọ bụrụ isi nke Nzukọ Ya, na onye isi kachasị elu nke ihe niile. Nzukọ Kristi bụkwa ahụ Ya, bụrụkwa ozuzu nke Onye ahụ na-arụzu ihe niile n’ime mmadụ niile.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU – Matiu 28:19-20
Aleluya, aleluya!
Gaanụ, kuziere mmadụ niile Oziọma M. A nọnyeere M ụnụ oge niile ruo na ngwụcha nke ụwa.
Aleluya!
OZIỌMA –Luk: 24:46-53
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu gwara Ụmụazụ Ya, sị: “Otu a ka e dere ya n’Akwụkwọ Nsọ na ‘Kristi ahụ ga-ahụ ahụhụ, sikwa n’ọnwụ bilie n’ụbọchị nke atọ; na malite na Jerusalem, a ga-ekwusakwara mba niile nchegharị na mgbaghara mmehie, n’aha Ya.’ Ụnụ onwe ụnụ bụ ndị akaebe ihe ndị a.
Lee, aga M eme ka Ihe ahụ Nna M kwere ụnụ na nkwa bịakwasị ụnụ. Ma nọdụnụ n’ime obodo a, ruo mgbe Chineke ga-eyikwasị ụnụ ike ahụ nke si n’eluigwe, dịka uwe.”
Mgbe Jesu kwusịrị okwu a, O duuru ndị ozi Ya pụọ, garuo ụzọ Betani. O wee chilie aka Ya elu, gọzie ha. N’oge Ọ na-agọzi ha ka, O siri n’ebe ha nọ pụọ.
O wee rọgoro n’eluigwe. Ụmụazụ Ya wee kpọọrọ Ya isi ala, werekwa oke ọñụ laghachi na Jerusalem. Ha nọgidere n’ụlọ nsọ Chineke na-enye Chineke ekele.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu