Ụka Nke Isii N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Oru: 8:5-8, 14-17
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 65:1-7, 16, 20 Az. 1
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
1 Pet:– 3:15-18
- OziọmaJon: 14:15-21
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Oru: 8:5-8, 14-17
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi
Filip jere otu obodo dị n’ala Sameria gwa ha okwuchukwu maka Kristi. Igwe mmadụ ndị obodo ahụ weere otu obi ñaa ntị n’ozi Filip n’ihi na ha hụrụ ọrụ ebube dị iche iche nke Filip n’onwe ya rụrụ.
N’ihi na site n’ọrụ ebube ndị a, mmụọ ọjọọ siri n’ahụ ọtụtụ ndị ha ji pụta na-eti mkpu n’oke olu. E mekwara ka ahụ dị ọtụtụ mmadụ ike, ma ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ ma ndị dara ngwọrọ.
Oke ọñụ wee dị n’obodo Sameria. Mgbe Ụmụazụ nọ na Jerusalem nụrụ na ndị Sameria anabatala okwu Chineke, ha zigaara ha Pita na Jọn. Mgbe ha bịaruru, ha kpeere ndị kwere ekwe ekpere, ka ha nata Mmụọ Nsọ.
N’ihi na Mmụọ Nsọ adakwasịbeghị onye ọ bụla n’ime ha. Naanị ihe e mere ha bụ mmirichukwu n’aha Onyenweanyị Jesu. N’oge ahụ, Pita na Jọn wee bikwasị ha aka n’isi, ha wee nata Mmụọ Nsọ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA –Ps: 65:1-7, 16, 20 Az. 1
Azịza: Ka ụwa niile tiere Chineke mkpu ọñụ. Ma ọ bụ Aleluya
1. Ụwa niile, tierenụ Chineke mkpu ọñụ.
Kweerenụ aha Ya ukwe otito.
Kwuputanụ otito Ya dị ebube.
Gwanụ Chineke: “Aka ọrụ Gị adịka omimi.”
Azịza: Ka ụwa niile tiere Chineke mkpu ọñụ. Ma ọ bụ Aleluya
2. Ka ụwa niile sekpuoro Gị,
bịakwa kwee ukwe otito Gị.
Bịanụ lee ọrụ nke Chineke.
Leenụ ọrụ ebube Ọ rụụrụ ụmụ mmadụ.
Azịza: Ka ụwa niile tiere Chineke mkpu ọñụ. Ma ọ bụ Aleluya
3. Ọ gbanwoola oke osimiri ka ọ ghọọ ala akọrọ.
Ha weere ụkwụ kufee osimiri.
N’ihi ya, ka anyị ñụrịanụ ọñụ n’ime Ya.
O ji ike dị egwu na-achịru mgbe ebighị ebi.
Azịza: Ka ụwa niile tiere Chineke mkpu ọñụ. Ma ọ bụ Aleluya
4. Ndị niile na-asọpụrụ Chineke, ngwa geenụ ntị.
Ka m kọọ akụkọ ọrụ ebube Ọ rụụrụ m.
Ngọzi dịrị Chineke onye na-ajụghị ịña ntị n’arịrịọ m.
Ọ jụghịkwa igosi m obi ọma Ya.
Azịza: Ka ụwa niile tiere Chineke mkpu ọñụ. Ma ọ bụ Aleluya
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ 1 Pet:– 3:15-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pita dị asọ dere
Sọpụrụnụ Kristi n’ime obi ụnụ. Nyekwanụ Ya ọnọdụ dịka Onyenwe ụnụ. Jikerekwanụ mgbe ọ bụla ịza ajụjụ ọ bụla mmadụ ga-ajụ ụnụ banyere olile anya ahụ ụnụ nwere.
Ma werekwanụ nwayọọ na nsọpụrụ kpee ọnụ ụnụ. Mekwaanụ ka akọnuche ụnụ dị ọcha, ka ọ ga-abụ, mgbe ndị mmadụ na-ekwutọ ụnụ n’ihi omume ọma ụnụ ji biri n’ime Kristi, ihere emee ha n’ihe ha na-ekwu.
N’ihi na ọ ka mma, ma ọ bụrụ uche nke Chineke, ka ụnụ hụ ahụhụ n’ihi na ụnụ na-eme ezi ihe, karịa ụnụ ịhụ ahụhụ n’ihi na ụnụ na-eme ihe ọjọọ. N’ihi na Kristi nwụrụ n’ihi ụnụ.
Ọ nwụrụ naanị otu mgbe n’ihi mmehie ụnụ. Onye ezi omume nwụrụ n’ihi ndị ajọ omume, ka O wee dugara ụnụ Chineke. N’ihi na e mere ka Ọ nwụọ n’anụ ahụ, ma e mekwara ka Ọ dị ndụ na mmụọ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU – Luk 24:32
Aleluya, aleluya!
Onye ọ bụla hụrụ M n’anya ga-edebe okwu m. Nna M ga-ahụ ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya.
Aleluya!
OZIỌMA –Jon: 14:15-21
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Jesu gwara Ụmụazụ Ya: “Ọ bụrụ na ụnụ hụrụ M n’anya, ụnụ ga-edebe iwu M niile. Aga M ekpekwara Nna M, Ọ ga-enyekwa ụnụ Onye Nkasi Obi ọzọ ka Ọ nọnyere ụnụ ruo mgbe ebighị ebi.
Onye Nkasi Obi ahụ bụ Mmụọ nke eziokwu, Onye ụwa na-apụghị ịnabata, n’ihi na ụwa adịghị ahụ Ya. Ụwa amaghịkwa Ya. Ma ụnụ ma Ya. N’ihi na Ọ nọnyeere ụnụ, birikwa n’ime ụnụ.
“Agaghị M ahapụ ụnụ dịka ndị na-enweghị nne na nna. Kama, aga M abịakwute ụnụ. Ọ fọdụrụ nwa oge ntakịrị ụwa agaghị ahụkwa M ọzọ. Ma ụnụ ga na-ahụ M n’ihi na adị M ndụ; Ụnụ onwe ụnụ ga-adịkwa ndụ.
N’ụbọchị ahụ, ụnụ ga-amata na anọ M n’ime Nna M; marakwa na ụnụ nọ n’ime M, Mụ onwe M nọkwa n’ime ụnụ. “Onye ọ bụla natara iwu M na-edebe ha bụ onye hụrụ M n’anya. Onye hụrụ M n’anya ka Nna M ga-ahụ n’anya. Aga M ahụkwa onye ahụ n’anya, bịakwa gosi ya onwe M.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu