Mọnde Izuụka nke Anọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Oru: 11:1-18
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 42: 2-3:43:3, 4
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJon: 10:11-18
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Oru: 11:1-18
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
N’oge ahụ, ụmụazụ na ụmụnna n’ime Kristi nọ na Judia niile nụrụ na ọbụladị ndị mba ọzọ anabatala okwu Chineke. Mgbe Pita garuru Jerusalem ndị Juu ndị na-ákwádó ka e bie ndị mba ọzọ ugwu, malitere na-ekwutọ ya, na-asị, “Gịnị mere I ji gakwuru ndị ebighị ugwu, soro ha rie nri.
Pita kọọrọ ha ihe niile merenụ site na isi mbido: “Anọ m n’obodo Jopa na-ekpe ekpere, hụ ọhụ. Ahụrụ m ihe dịka nnukwu ukwu-akwa nke e jidere n’akụkụ anọ ka o si n’eluigwe gbadata ebe m nọ.
Mgbe m lere ya anya nke ọma, ahụrụ m ụmụanụmaanụ dị iche-iche, anụ ọhịa ndị na-eri ibe ha, anụ ndị na-akpụ akpụ, na ụmụnnụnụ dị iche-iche. Anụkwara m otu olu ka ọ na-asị m, “Pita! Bilie, gbuo ma rie” Azara m olu ahụ sị “mba, Onyenweanyị: n’ihi na ihe ọbụla rụrụ arụ ma ọ bụ nke adịghị ọcha ababeghị m n’ọnụ.
Ma olu ahụ si n’eluigwe zaghachiri sị, “Ihe ọbụla Chineke mere ka ọ dị ọcha, i nweghị ike ọbụla ịkpọ ya ihe rụrụ arụ.” Ihe a mere ugboro atọ, e bughachikwa ihe ahụ n’eluigwe.
N’otu mgbe ahụ, ụmụnwoke atọ ndị e si Sizeria zite ka ha kpọọ m bịaruru n’ụlọ ebe anyị nọ. Mmụọ Nsọ gwara m ka m soro ha gaa, n’akpaghị oke ọbụla.
Mụ na ụmụnna mmadụ isii ndị a soro gaa banye n’ụlọ nwoke ahụ. Ọ kọọrọ anyị otu o si hụ mmụọọma ka ọ kwụ n’ụlọ ya, na-asị, “Ziga ozi na Jopa, ka a kpọtara gị Saịmọn onye a na-akpọkwa Pita.
Ọ ga-agwa gị okwu nke Chineke ga-eji zọpụta gị na ezinụụlọ gị niile. Mgbe m malitere ịgwa ha okwu, Mmụọ Nsọ dakwasara ha otu o si dakwasa anyị na mbido.
N’oge ahụ echetakwara m ihe Onyenweanyị kwuru, sị, “Jọn ji mmiri mee ụnụ mmirichukwu, ma a ga-eji Mmụọ Nsọ mee ụnụ mmirichukwu, Ebe ọ bụ na Chineke enyela ha ụdị onyinye ahụ o nyere anyị mgbe anyị kwenyere n’Onyenweanyị Jesu Kristi, onye ka m bụ igbochi ọrụ Chineke?”
Oge ha nụrụ ihe ndị a, ha kwụsịrị nkagbu ha na-akagbu Pita, too Chineke sị, “O! Chineke enyekwala ọbụladị ndị mba ọzọ ohere ichegharị nweta ndụ.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 42: 2-3:43:3, 4
Azịza: Akpịrị na-akpọ m nkụ maka Chineke.
1. Dịka otu agụụ mmiri si na-agụ nne ele,
otu ahụ ka agụụ si na-agụ m maka gị, O Chineke m.
Akpịrị na-akpọ m nkụ maka Chineke,
Chukwu nke ndị dị ndụ,
kedụ oge m ga-enwe ike jee hụ ihu nke Chineke?
Azịza: Akpịrị na-akpọ m nkụ maka Chineke.
2. Zipụta ihè Gị na eziokwu Gị ka ha na-edu m,
ka ha dubata m n’ugwu gị dị nsọ,
ebe I jiri mere ebe obibi.
Azịza: Akpịrị na-akpọ m nkụ maka Chineke.
3. Mgbe ahụ aga m aga n’ebe nchụaja nke Chineke,
Chineke nke bụ añụrị m.
Aga m eji añụrị were ụbọ too gị,
Onyenweanyị, Chineke m.
Azịza: Akpịrị na-akpọ m nkụ maka Chineke.
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
“Abụ m ezigbo onye ncheatụrụ, a maara m atụrụ m, atụrụ m marakwa m.”
ALLELUIA.
OZIỌMA –Jon: 10:11-18
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Jesu kwuru sị “Abụ m ezigbo onye ncheatụrụ. Ezigbo onye ncheatụrụ na-atọgbọ ndụ ya maka atụrụ ya. Onye bụ onye ngo nke na-abụghị onye ncheatụrụ, onye atụrụ na-abụghị nke ya, na- ahapụ atụrụ gbalaga, mgbe ọ hụrụ ka agụ na-abịa. Agụ ewee dọgbuo atụrụ ma chụsakwaa ha.
Ọ na-agbalaga n’ihi na ọ bụ onye ọrụ ngo, ọ kpọghịkwa atụrụ ahụ ihe. Abụ m ezigbo onye ncheatụrụ, a maara m atụrụ m, atụrụ m marakwa m. Dịka Nna m si mara m, m marakwa Nna m, ana m atọgbọ ndụ m n’ihi atụrụ m.
Enwekwara m igwe atụrụ ọzọ, ndị na-anọghị n’ime ogige atụrụ nke a. Aga m akpọbatakwarịrị ha, ha ga-anụkwa olu m. Mgbe ahụ naanị otu igwe atụrụ na otu onye ncheatụrụ ga-adị.
Maka nke a ka Nna m ji hụ m n’anya n’ihina ana m atọgbọ ndụ m ka m wee were ya ọzọ. O nweghị onye ọbụla na-anapụ m ndụ m, kama eji m aka m atọgbọ ya. Enwere m ike ịtọgbọ ya nwekwa ike were ya ọzọ. Iwu nke a ka m natara n’aka Nna m.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu