Ụka Nke Anọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Oru: 2:14, 36-41
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 22:1-6 Az. 1
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
1 Pet: 2:20-25
- OziọmaJon: 10:1-10
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Oru: 2:14, 36-41
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi
Ma Pita guzoro, ya na Ụmụazụ iri na otu ahụ, wee welie olu ya gwa ọgbakọ ahụ okwu, sị: “Ndị Juu ibe m, na ụnụ niile bụ ndị bi na Jerusalem! Geenụ ntị ka m kọwaara ụnụ ihe ndị a.
Geekwanụ ntị n’okwu m chọrọ ikwu! Ana m eme ka ndị Izrel niile mara nke ọma na Chineke emeela Jesu Onye ụnụ kpọgidere n’obe ka Ọ bụrụ Onyenweanyị na onye nzọpụta anyị.
Ma mgbe ọgbakọ ahụ nụrụ nke a, ihe a wee dụọ ha na mkpụrụ obi. Ha wee sị Pita, na ndị ozi ndị ọzọ: “Ụmụnna anyị, gịnị ka anyị ga-eme”? Pita wee sị ha: “Chegharịanụ, sitekwanụ na mmehie ụnụ tụgharịa bịakwute Chineke; ka e mee ụnụ mmirichukwu n’aha Jesu Kristi.
Chineke ga-agbagharakwa ụnụ mmehie ụnụ niile. Ụnụ ga-anatakwa onyinye a, bụ Mmụọ Nsọ. N’ihi na ọ bụ ụnụ, na ụmụ ụnụ, na ndị niile nọ n’ebe dị anya, ka nkwa ahụ dịịrị – bụ ndị niile Onyenweanyị bụ Chineke anyị, ga-akpọtara onwe Ya”.
Pita jikwa ogologo okwuchukwu gwasie ọgbakọ ahụ ike, na-arịọkwa ha, sị: “Zọpụtanụ onwe ụnụ n’ahụhụ ga-adakwasị ọgbọ nke a gbagọrọ agbagọ”. Ọtụtụ mmadụ ndị nụrụ okwu ya wee kwere na Kristi, e wee mee ha mmirichukwu. N’ụbọchị ahụ, Chineke tụkwasịịrị ha ihe ruru puku mmadụ atọ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA –Ps: 22:1-6 Az. 1
Azịza: Dinwenụ bụ onye nche m; o nwekwaghị ihe m ga-achọ.
1. Dinwenụ bụ Onye nche m. O nwekwaghị ihe m ga-achọ.
Ebe ahịhịa ndụ juru eju ka Ọ na-enye m ezumike.
Ọ na-eduga m n’akụkụ mmiri ka m zuru ike, ka m were kutakwa ume.
Azịza: Dinwenụ bụ onye nche m; o nwekwaghị ihe m ga-achọ.
2. Ọ na-edu m n’ụzọ ezi omume n’ihi aha Ya.
Ọ bụrụgodụ na m na-aga na ndagwurugwu ọchịchịị,
agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọ bụla.
N’ihi na I ji mkpara na ngu Gị nọnyere m.
Ọ bụ ha na-akasị m obi.
Azịza: Dinwenụ bụ onye nche m; o nwekwaghị ihe m ga-achọ.
3. I ji aka Gị kwadoro m oriri nke m ga-eri n’ihu ndị iro m.
I ji aka Gị tee m ude n’isi.
Iko m ejula n’ọnụ,
Azịza: Dinwenụ bụ onye nche m; o nwekwaghị ihe m ga-achọ.
4. Ịdị mma na obi ọma ga na-agbaso m,
ụbọchị niile nke ndụ m.
Aga m ebi n’ụlọ nke Onyenweanyị,
ebighị ebi ebighị ebi.
Azịza: Dinwenụ bụ onye nche m; o nwekwaghị ihe m ga-achọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ –Pet: 2:20-25
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ nke Pita dị asọ dere
Ụnụ maara na o nweghị otito ụnụ ga-enwe n’ihi na ụnụ ji ndidi anagide ahụhụ nke a na-enye ụnụ n’ihi ihe ọjọọ ụnụ mere. Ma ọ bụrụ na ụnụ na-anagide ahụhụ nke a na-enye ụnụ n’ihi ihe ọma ụnụ na-eme, ụnụ ga-enweta ngọzi n’aka Chineke.
Ọ bụ ime ihe dị otu a ka Chineke ji kpọọ ụnụ. N’ihi na Kristi tara ahụhụ n’ihi ụnụ, wee hapụrụ ụnụ ihe ịma atụ nke ụnụ ga na-eso. O meghị njọ ọ bụla. Ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla okwu ụgha si n’ọnụ Ya pụta.
O kwutọghị onye ọ bụla mgbe ha na-ekwutọ ya. Ọ baghị mba ọ bụla mgbe ha na-ata ya ahụhụ, kama naanị ihe o mere bụ iwere ihe niile nyefee n’aka Chineke onye na-ekpe ikpe ziri ezi.
Dịka ihe e ji achụ aja, Ya onwe Ya buuru mmehie niile anyị mere n’ahụ Ya ruo n’elu obe. O mere nke a ka anyị wee nwụọ n’ebe mmehie dị, bịakwa na-adị ndụ nke ezi omume.
E sitekwara na apa ọnya dị ya na ahụ gwọọ ụnụ. Na mbụ, ụnụ dị ka ụmụ atụrụ na-awagharị na-achọ ụzọ, ma ugbu a e meela ka ụnụ laghachikwute onye na- azụ ụnụ dị ka atụrụ, na onye na-echebe mkpụrụ obi ụnụ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU – Jọn. 10:14
Aleluya, Aleluya!
Onyenweanyị kwuru sị: “Abụ M ezigbo onye nche atụrụ. Amaara M atụrụ M, atụrụ M makwara M.
Aleluya!
OZIỌMA –Jon: 10:1-10
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Jesu kwuru sị: “Eziokwu ka M na-agwa ụnụ: Onye ọ bụla nke na-esighị n’ọnụ-ụzọ banye n’ogige atụrụ, nke na-esi n’ebe ọzọ ụzọ na-adịghị arịba, bụ onye ohi na onye na-apụnarị mmadụ ihe n’ike.
Ma onye na-esi n’ọnụ ụzọ abanye bụ onye ọzụzụ atụrụ. Onye na-eche ọnụ ụzọ ogige atụrụ na-emeghere ya ụzọ. Atụrụ ya maara olu ya. Ọ na-akpọkwa atụrụ ya aha, wee na-edupu ha.
Oge ọ bụla ọ chịpụrụ atụrụ ya, ọ na-aga n’ihu ha. Ha na-eso ya n’azụ, n’ihi na ha maara olu ya. Ma ha agaghị eso onye ọbịa. Kama ha ga-agbara ya ọsọ. N’ihi na ha amaghị olu ya”.
Ilu a ka Jesu tụụrụ ha. Ma ha aghọtaghị ihe Ọ na-agwa ha. Jesu wee gwa ha ọzọ sị: “N’ịgwa ụnụ eziokwu: Mụ onwe M bụ ọnụ ụzọ nke ogige atụrụ. Ndị niile buuru M ụzọ bịa bụ ndị ohi na ndị na-apụnarị mmadụ ihe n’ike.
N’ihi nke a atụrụ añakwaghị ha ntị. Mụ onwe M bụ ọnụ ụzọ ahụ. Ọ bụrụ na onye ọ bụla esi na M baa, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ, na-abatakwa, na-achọtakwa nri ọ ga eri. Onye ohi na-abịa naanị ka o wee zuo ohi, gbuo mmadụ, laakwa ihe n’iyii. Ma Mụ onwe M bịara ka ha wee nwee ndụ, nwekwaa ya n’uju.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu