Emume Ncheta Maak dị Asọ – Ode Oziọma.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
1 Pet: 5:5-14
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 89: 2-3, 6-7, 16-17
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMak: 16:15-20
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –1 Pet: 5:5-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pita dere
Otu ahụkwa, ụnụ ndị na-eto eto, na-eruberenụ ndị okenye isi. Yirinụ umeala ka uwe, jeerenụ ibe ụnụ ozi. N’ihina: Chineke na-emegide ndị mpako, ma ndị dị umeala n’obi ka ọ na-enye amara.
Wedatanụ onwe ụnụ n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka o welite ụnụ mgbe oge ya ruru. Hapụrụnụ ya nsogbu ụnụ niile, n’ihina mkpa ụnụ niile na-emetụ ya n’obi.
Anya doo ụnụ! Na-echenụ nche! N’ihina onye iro ụnụ, bụ Ekwensu, na-awagharị dịka ọdụm na-agbọ ụja, na-achọ onye ọ ga-eri. Ma kwụdosienụ ike n’okwukwe ụnụ.
Ụnụ ekwekwala ya. Ụnụ maara nke ọma na ndị ụmụnna anyị n’ime Kristi n’ebe niile n’ụwa na-ahụ ụdị ahụhụ ndị a ụnụ na-ahụ. Mgbe ụnụ hụchara ahụhụ nwa oge, Chineke nke amara niile, onye kpọrọ ụnụ n’ime Kristi ka ụnụ keta oke n’ebube ebighịebi nke ya, ga-eme ka ụnụ zuo oke.
Ọ ga-enye ụnụ ike, mekwaa ka ụnụ kwụdosie ike. Ka ike niile bụrụ nke ya ruo mgbe ebighịebi. Amen. Edeteere m ụnụ nwa nkenke akwụkwọozi a site n’inye aka nke Slivanọs nwanne anyị, onye m hụrụ na o kwesịrị ntụkwasịobi.
Ana m arịọ ụnụ, na-ekwupụtakwa na nke a bụ amara Chineke n’ezie; kwụdosienụ ike n’ime ya. Nwanne ụnụ nwaanyị ahụ bi na Babịlọn, onye Chineke họpụtara ụnụ na ya, na-ekele ụnụ. Nwa m, bụ Mak, na ekelekwa ụnụ.
Nyerịtanụ onwe ụnụ ekele nke ịhụnaanya. Udo dịrị ụnụ niile, ndị nọ n’ime Kristi.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 89: 2-3, 6-7, 16-17
Azịza: Aga m eji ukwe kwupụta ịhụnaanya nke Onyenweanyị ebeebe ebeebe
1. Aga m eji ukwe kwupụta ịhụnaanya nke Onyenweanyị ebeebe ebeebe
bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ
aga m na-ekwupụta ntụkwasịobi gị
N’ihina ịhụnaanya gị ga-adị ebeebe,
ikwesi ntụkwasịobi gị ga-akwụdosi ike dịka igwe.
Azịza: Aga m eji ukwe kwupụta ịhụnaanya nke Onyenweanyị ebeebe ebeebe
2. Eluigwe niile na-eto ọrụ ebube gị, O Osebụrụwa
ndị nsọ niile na-etokwa ikwụdosiike gị
O nwere onye a ga-eji tụnyere gị n’eluigwe, Onyenweanyị?
O nwere Mmụọozi gị na ya ha?
Azịza: Aga m eji ukwe kwupụta ịhụnaanya nke Onyenweanyị ebeebe ebeebe
3. Ngọzi ga-adịrị ndị niile ji ukwe eto gị
Ndị na-aga n’ihe nke obiọma gị, O Onyenweanyị
Ha ga-añụrị ọñụ n’aha gị ụbọchị niile,
nyekwa gị otito maka eziomume gị.
Azịza: Aga m eji ukwe kwupụta ịhụnaanya nke Onyenweanyị ebeebe ebeebe
MBEKU – 1 Cor 1:23-24
Alleluia, Alleluia:
Anyị onwe anyị na-ekwusa Kristi, onye a kpọgburu n’obe; onye bụ ike na amamihe nke Chineke.
Alleluia.
OZIỌMA –Mak: 16:15-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, Gaanụ nụuwa niile, kwusaaranụ ihe niile e kere eke oziọma. Onye nke kwerenụ, e mekwaa ya mmirichukwu, ka a ga-azọpụta, ma onye nke na-ekwenyeghị ka a ga-ama ikpe.
Ihe ịrịbaama ndị a ga-esokwa ndị kwerenụ: ha ga-achụpụ ajọ mmụọ n’aha m; ha ga-ekwu okwu n’asụsụ dị icheiche. Ọ bụrụ na ha achịrị agwọ n’aka, mọbụ ñụọ ihe ọbụla na-eweta ọnwụ, ọ gaghị emerụ ha ahụ.
Ha ga-ebikwasakwa ndị ọrịa aka, ahụ ha adịkwa ha mma. Ya mere mgbe Dinwenụ Jesu gwachara ha okwu, ọ rịgoro n’eluigwe wee nọrọ n’aka nri nke Chukwu.
Ndị na-eso ụzọ ya pụkwara kwusaba oziọma n’ebe niile, ebe Dinwenụ sokwa ha na-arụ ọrụ. Ọ na-emekwa ka okwu ha kwụsie ike site n’ihe ịrịbaama nke na-eso ya. Amen.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu