Nnukwu Emume Ncheta Joseph dị Asọ – Di Marịa dị Ngọzi.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
2 Sam: 7:4-5, 12-14, 16
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 89: 1-2, 3-4, 26, 28.
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Rom: 4:13, 16-18
- OziọmaMat: 1:16, 18-21. MA Ọ BỤ Luk: 2:41-51
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –2Sam: 7:4-5, 12-14, 16
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi abụọ nke Samuel
Yahweh ziri Natan sị, “Jee gwa odibo m, bụ Devid, na m sị ya, Ọ bụ gị ga-arụrụ m ụlọ ebe m ga ebi? Mgbe Ị nwụrụ, elie gị ebe e liri nna gị ha, aga m eme ka otu n’ime ụmụ gị ndị nwoke bụrụ eze.
Aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike. Ya onwe ya bụkwa onye ga-ewuru m ụlọnsọ. Aga m emekwa ka ọchịchị ya dị ebeebe. Aga m abụ nna ya; Ọ ga-abụ kwa nwa m.
Mgbe ọbụla ọ mere ihe ọjọọ, aga m enye ya ahụhụ dịka nna sị adụ nwa ya ọdụ site n’inye ya ahụhụ. Ezinụụlọ gị na alaeze gị ga-adị ebeebe. Aga m akwụdosi ocheeze gị ike ebeebe.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 89: 1-2, 3-4, 26, 28.
Azịza: Ọchịchị Nwa nke Devid ga-adị ebeebe ebeebe.
1. Aga m eji ukwe kwupụta ịhụnaanya nke Onyenweanyị ebeebe ebeebe,
bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ aga m na-ekwupụta ntụ kwasịobi gị.
N’ihina ịhụnaanya gị ga-adị ebeebe,
ikwesi ntụkwasịobi gị ga-akwụdosike dịka igwe.
Azịza: Ọchịchị Nwa nke Devid ga-adị ebeebe ebeebe.
2. Gị kwuru sị, “Mụ na onye m họọrọ agbala ndụ,
añụọrọla m Devid nwodibo m iyi.
Aga m eme ka ọchịchị gị dị ebeebe,
Aga m emekwa ka ocheeze gị digide ruo na ndụdụgandụ niile.
Azịza: Ọchịchị Nwa nke Devid ga-adị ebeebe ebeebe.
3. Ọ ga ebeku m sị, “Ịbụ nna m,
Chineke m na onye enyemaka m.
Aga m ahụ ya n’anya ebeebe,
ọgbụgbandụ mụ na ya ga-adị ọkpụ.
Azịza: Ọchịchị Nwa nke Devid ga-adị ebeebe ebeebe.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ –Rom: 4:13, 16-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl degaara ndị Rom
Nkwa Chineke kwere Abraham na agbụrụ ya na ha ga-eketa ụwa abụghị site n’idebe iwu, kama ọ bụ site n’okwukwe. N’ihi nke a, Chineke mere ka nkwa ahụ dabere n’okwukwe, ka o wee bụrụ ihe mmadụ ga-enweta site n’amara, ka o rutechaa agbụrụ Abraham niile, Ọ bụghị sọ ndị na -edebe iwu, kama ndị niile nwere ụdị okwukwe Abraham, onye bụ nna anyị n’okwukwe.
Dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo; “Emeela m gị nna nke ọtụtụ mba,” n’ihu Chineke, Abraham bụ nna anyị n’okwukwe, onye o tinyere okwukwe ya na ya, onye na-enye ndị nwụrụ anwụ ndụ, na-emekwa ka ihe adịghị adị dịrị.
Abraham nọgidere n’okwukwe na olile anya, ọ bụladị mgbe olile anya adịghị, o wee site na nke a ghọọ “Nna nke ọtụtụ mba.” N’ihina otu a ka a gwara ya n’Akwụkwọ Nsọ, sị, “Ụmụ si n’agbụrụ gị ga-adị ọtụtụ.” N’ihi nke a ka Chineke ji site n’okwukwe “gụọ Abraham n’onye eziomume.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU
ALLEUIA, ALLELUIA:
Ha bụ ndị agọziri agọzi, ndị bi n’ụlọ gị na-ekwere gị ukwe otito oge niile.
ALLELUIA.
OZIỌMA –Mat: 1:16, 18-21.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jekọb mụtara Josef di Marịa bụ nne Jesu, onye a na-akpọ Kristi. Otu a ka esiri mụọ Jesu Kristi: Mgbe ndị ikwunibe kwekọrịtara na Josef ga-alụ Marịa nne Jesu, a hụrụ na Marịa dị ime site na Mmụọ Nsọ tupu ha ebikọọ ọnụ.
Mana di ya bụ Josef, bụ onye eziomume, ọ chọghị imenye ya ihere kama o kpebiri ịchụ ya na nzuzo. Mgbe ọ na-atule ihe ndị a n’obi ya, mmụọọma nke Onyenweanyị bịakwutere ya na nrọ, sị ya, “Josef, nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Marịa nwunye gị, n’ihina nwa ọ dị ime ya sitere n’ike nke Mmụọ Nsọ. Ọ ga-amụ nwa nwoke, Ị ga-agụ ya Jesu, n’ihina ọ ga-azọpụta ndị nke ya na njọ ha niile.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu
MA Ọ BỤ
OZIỌMA –Luk: 2:41-51
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Kwa afọ, nne na nna Jesu na-aga Jerusalem n’oge emume ngabiga. Mgbe Jesu gbara afọ iri na abụọ, ya na nne ya na nna ya soro gaa dịka omenaala si dị; Oge e mechara emume ahụ, ka ha na-alaghachi, nwata ahụ bụ Jesu nọdụrụ na Jerusalem.
Nne na nna ya amataghị. Ha chere na o sonyere n’etiti ndị mmadụ. Ha gara ije otu ụbọchị tupu ha bido chọba ya n’etiti ndị ikwunibe ha na ndị ha maara. Mgbe ha na-achọtaghị ya, ha laghachiri azụ na Jerusalem na-achọgharị ya.
Mgbe ụbọchị atọ gachara, ha hụrụ ya n’ime ụlọnsọ Chineke, ka ọ nọ n’etiti ndị nkuzi na-ege ha ntị na-ajụkwa ha ajụjụ. Nghọta na ọgụgụ isi o ji aza ajụjụ tụrụ ndị niile nụrụ okwu ya n’anya.
Mgbe nne na nna ya hụrụ ya ọ tụrụ ha n’anya. Nne ya wee sị ya, “Nwa m, gịnị mere i ji mee mụ na nna gị otu a? Lee, mụ na nna gị na-achọgharị gị kamgbe.”
Ma ọ zara ha sị, “Gịnị ka ụnụ na-achọgharịrị m, ọ bụ na ụnụ amaghị na-aga m anọrịrị n’ụlọ nna m.” Ha aghọtaghị okwu ọ gwara ha. O soro ha laghachi na Nazaret, na-erubekwara ha isi, nne ya dobere okwu ndị a niile n’obi ya
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu