Tọọzde n’ime Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Esta: 12:14-16, 23-25
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 138: 1-2, 2-3,7-8.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMat: 7:7-12
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – Esta: 12:14-16, 23-25
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Esta
N’oge ahụ, Ezenwanyị Esta jupụtara na nnukwu egwu, were gbakwuru Chineke. Mgbe ahụ ka ọ rịọrọ Chineke nke Izrel arịrịọ sị: O Chineke m, sọọsọ gị bụ Eze anyị; nyere m aka, mụ onye nọ naanị ya, na-enweghị onye enyemaka belụsọ gị.
Maka na egwu ejidela m. Site n’oge a mụrụ m, ana m anụ ka ndị ala anyị na-ekwu na ọ bụ gị onwe gị O Chineke, siri na mba niile were họrọ Izrel, họrọkwa nna anyị ha n’ebe agbụrụ nnanna ha dị, ka ha bụrụ ihe nketa nke gị oge niile, ndị Ị na-emezuru ihe niile I kwere ha na nkwa.
Cheta O Chineke; mee ka mba niile mara gị n’oge nke a anyị nọ na nsogbu. Gbaa m ume, O Eze nke chi niile na nnaukwu nke ike ọchịchị niile. Biko nye m onyinye ikwupụta okwu nke ọma mgbe m ga-akwụrụ n’ihu ọdụm, ma gbanwoo mmụọ ya ka iwe ya dị ọkụ n’ebe onye ahụ na-alụso anyị ọgụ nọ, ka o were hụ njedebe nke ndụ ya na nke ndị niile dọnyeere ya ukwu.
Ma zọpụtakwa anyị, nyere m aka, n’ihi na-anọ m sọ naanị m, n’enweghị onye enyemaka ọbụla belụsọ gị, O Chineke. Ị mazu ihe niile.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 138: 1-2, 2-3,7-8.
Azịza: Onyenweanyị n’ụbọchị m kpọkuru gị, ị zara m.
1. Eji m obi m niile na-ekele gị Onyenweanyị,
n’ihi na ị nụla ekpere m!
N’ihu ndị mmụọozi niile aga m ekwere gị ukwe;
Aga m akpọ isiala n’ụlọnsọ gị,
nye gị ekele.
Azịza: Onyenweanyị n’ụbọchị m kpọkuru gị, ị zara m.
2. N’ihi ịhụnaanya na ịkwụdosiike gị;
n’ihina aha gị na nkwa gị kacha dị elu.
N’ụbọchị m kpọkuru gị, ị zara m,
mekwa ka ike m bawanye.
Azịza: Onyenweanyị n’ụbọchị m kpọkuru gị, ị zara m.
3. Ị na-esetịpụ aka gị zọpụta m.
Akanri gị ga-emere m ihe niile Onyenweanyị,
Chineke ịhụnanya gị na-adị ebeebe.
Ahapụkwala anyị ndị i kere.
Azịza: Onyenweanyị n’ụbọchị m kpọkuru gị, ị zara m.
MBEKU – Jọn 11:25, 26
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
keye m obi dị ọcha, Chineke m; weghachitere m ọṅụ nke nzọpụta gị.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA –Mat: 7:7-12
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Jesu gwara ndị n’eso ụzọ ya sị: “Rịọ, ị ga-arịọta; chọọ ị ga-achọta; kụọ aka, a ga-emeghere gị ụzọ. N’ihi na onye ọbụla rịọrọ ga-arịọta, onye ọbụla chọrọnụ ga-achọta, onye ọbụla kụrụ aka a ga- emeghere ya.
O nwere onye n’ime ụnụ ọ ga-abụ nwa ya rịọ ya achịcha o nye ya okwute? Ma ọ bụ ọ rịọ ya azụ, o nye ya agwọ? Ọ bụrụ na ụnụ bụ ndị obi ọjọọ maara ka e si enye ụmụ ụnụ ihe dị mma, ọ bụ na Nna ụnụ nke eluigwe agaghị enye ndị niile na-arịọ ya arịrịọ ihe ọma.
Ya bụ, meerenụ ndị ọzọ ihe ọbụla ụnụ na-achọ ka ha meere ụnụ; nke a bụ isi nkuzi iwu Mosis na ndị amụma.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu