Tuzde Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Isaiah: 55:10-11
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 34:4-5,6-7,16- 17.18-19.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMat: 6:7-15
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – Isaiah: 55:10-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya
Dịka otu mmiri ozuzo na akụmmiriigwe na-esi n’eluigwe ezo anaghị alaghachi azụ ruo mgbe ọ gbasara mmiri n’ụwa, bịa mezie ala ka o mee ihe akụkụ ka o pupụta, nye onye ọrụ ugbo ihe oriri ọ ga- eri.
Otu a ka okwu na-esi m n’ọnụ apụta si adị, o nweghị ike ịgba aka lọghachikwute m, kama ọ ga-emejupụta ihe m bu n’obi, ma mezuokwa ihe m jiri maka ya zipụ ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 34:4-5,6-7,16- 17.18-19.
Azịza: N’ime ahụhụ ha niile Onyenweanyị na-azọpụta ndị umeala.
1. Soronụ m kwupụta ịdịukwu nke Onyenweanyị,
Soronụ m too aha ya,
Akpọkuru m Onyenweanyị Ọ zaa m,
Ọ zọpụtara m n’egwu niile na-atụ m.
Azịza: N’ime ahụhụ ha niile Onyenweanyị na-azọpụta ndị umeala.
2. Ihu ọbụla chere n’ebe Onyenweanyị nọ na-amụke-amụke,
ihere anaghị eme ya ma ọlị.
Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye,
Ọ na-enyekwara ya aka na nsogbu ya niile.
Azịza: N’ime ahụhụ ha niile Onyenweanyị na-azọpụta ndị umeala.
3. Onyenweanyị na-elekọta ndị eziomume anya,
Ọ na-egekwa mkpu akwa ha ntị,
Mana Onyenweanyị na-agbarụ ihu n’ebe ndị ajọomume nọ,
Ọ na-eme ka a ghara ichetakwa ha n’ụwa.
Azịza: N’ime ahụhụ ha niile Onyenweanyị na-azọpụta ndị umeala.
4. Ndị eziomume kpọkuru Onyenweanyị, Ọ zaa ha,
wee zọpụta ha na nsogbu ha niile.
Onyenweanyị na-anọ ndị obi loghara elogha nso,
na-enyere ndị dara mba na mmụọ aka.
Azịza: N’ime ahụhụ ha niile Onyenweanyị na-azọpụta ndị umeala.
MBEKU – Ps. 130: 5, 7.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Ọ bụghị naanị site na nri ka mmadụ si adị ndụ, kama site n’okwu ọbụla nke si n’ọnụ Chineke pụta.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA –Mat: 6:7-15
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Jesu gwara ndị n’eso ụzọ ya sị: “Mgbe ụnụ na-ekpe ekpere, ụnụ ekwukwala ọtụtụ okwu na- abaghị uru, dịka ndị mba ọzọ si eme; n’ihi na ha na-eche na site n’ọtụtụ okwu, Chineke ga-anụ ekpere ha.
Ụnụ emekwala ka ha, n’ihina Nna ụnụ maara mkpa ụnụ tupu ụnụ arịọ ya. Ya bụ, na-ekpenụ ekpere otu a: “Nna anyị nọ n’eluigwe ka otito dịrị aha Gị Ka ọchịchị Gị bịa, ka e mee uche Gị n’ụwa, Dịka e si eme ya n’eluigwe.
Nye anyị taata nri nke ụbọchị anyị; Gbaghara anyị mmehie anyị dịka anyị si gbaghara ndị mehiere anyị. Ekwela ka anyị kwenye na nranye Ma zọpụta anyị n’ajọ ihe’.
N’ihi na ọ bụrụ na ụnụ agbaghara ndị mmadụ mmehie ha, Nna ụnụ nke bi n’eluigwe ga-agbagharakwa ụnụ; mana ọ bụrụ na ụnụ agbagharaghị ibe ụnụ mmehie ha mere ụnụ, Nna ụnụ agaghị agbaghara ụnụ mmehie ụnụ
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu