Mọnde Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Lev: 19:1-2, 11-18
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 19: 8,9,10,15.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMat: 25:31-46
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – Lev: 19:1-2, 11-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Levitikọs
Yahweh gwara Mosis okwu sị, “Gwa ọgbakọ Izrel niile okwu ndị a: Dịnụ nsọ n’ihi na mụ onwe m bụ Yahweh, Chineke ụnụ dị nsọ.” Ụnụ agaghị ezu ohi, ma ọ bụ tụọ asị, ma ọ bụ ghọgbuo ibe ụnụ.
Ụnụ agaghị eji aha m añụ iyi asị wee merụọ aha Chineke ụnụ. Abụ m Yahweh. Ụnụ emegbula ma ọ bụ nara onye agbataobi ụnụ ihe ya n’ụzọ na-ezighị ezi. Ụgwọ onye ọrụngo ụnụ agaghị anọ n’aka ụnụ chi abọọ.
Ụnụ agaghị akpọ onye ogbi iyi, ma ọ bụ dochiere onye isi ihe n’ụzọ. Ụnụ ga na-atụrụ Chineke ụnụ egwu. Abụ m Yahweh. “Ụnụ ekpela ikpe na-ezighị ezi. Ụnụ adọnyerela onye ọbụla ukwu n’ikpe, ma ọ bụ ogbenye ma ọ bụ ọgaranya.
Ụnụ ga-eji ikpe nkwụmọtọ kpee onye agbataobi ụnụ ikpe.” Ụnụ agaghị ekwutọ ibe ụnụ. Ụnụ agaghịkwa eme ihe ọbụla ga-etinye ndụ onye agbataobi ụnụ na nsogbu. Abụ m Yahweh.
Ị gaghị eburu nwanne gị iwe n’obi, ị ga-eji obi ọcha gwa onye agbataobi gị mmehie ya, ka ị ghara iketa oke na mmehie ya, Achọla ka i megwara ihe mmadụ mere gị, ma ọ bụ buru iro n’obi megide nwanne gị, kama hụ onye agbataobi gị n’anya dịka i siri hụ onwe gị n’anya. Abụ m Yahweh.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 19: 8,9,10,15.
Azịza: Okwu gị bụ mmụọ na ndụ.
1. Iwu nke Onyenwanyị kwụ ọtọ;
Ọ na-enye mkpụrụobi ndụ ọhụrụ,
Atụmaatụ Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasị obi
Ọ na-enye ndị dị umeala amamihe.
Azịza: Okwu gị bụ mmụọ na ndụ.
2. Iwu nke Onyenweanyị kwụ ọtọ,
ọ na-enye obi añụrị;
Iwu nke Onyenweanyị pụtara ihe;
ọ bụ ihe e ji ahụ ụzọ.
Azịza: Okwu gị bụ mmụọ na ndụ.
3. Ịtụ egwu Onyenweanyị bụ ihe dị mma;
ọ na-adị ebeebe;
ikpe nke Onyenweanyị bụ eziokwu;
Ha niile kwụkwa ọtọ.
Azịza: Okwu gị bụ mmụọ na ndụ.
4. Mee ka okwu niile si m n’ọnụ apụta oge niile,
na echiche obi m niile dị mma n’ihu gị,
Onyenweanyị, nkume m, na onye nzọpụta m.
Azịza: Okwu gị bụ mmụọ na ndụ.
MBEKU – Jọn 6: 64,69
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Lee, ugbu a bụ oge a nabatara nke ọma; lee, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – Mat: 25:31-46
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Jesu gwara ndị n’eso ụzọ ya sị: Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya, ya na ndị mmụọọma niile, ọ ga-anọkwasị n’oche eze ya dị ebube. A ga-akpọkọta mba niile n’ihu ya, ọ ga-ekewa ha iche-iche dịka otu onye ọzụzụ atụrụ si ekewapụta atụrụ n’etiti ewu.
Ọ ga-edobe atụrụ n’aka nri ya. dobe ewu n’aka ekpe ya. Mgbe ahụ, onye eze ga-asị ndị nọ n’aka nri ya: “Bịanụ, ụnụ ndị dị ngọzi nke nna m, bịanụ ka ụnụ were alaeze nke a kwadobere ụnụ site na mbido nke ụwa; n’ihi na mgbe agụụ na-agụ m ụnụ nyere m nri, mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ ụnụ nyere m mmiri.
A bụ m onye ọbịa, ụnụ nabatara m. Agba m ọtọ, ụnụ yibe m akwa, mgbe m nọ n’ọrịa, ụnụ bịara leta m, anọ m n’ụlọ mkpọrọ, ụnụ bịakwutere m. Mgbe ahụ ndị eziomume ga-aza ya sị: ‘Onyenweanyị, olee mgbe anyị hụrụ ka agụụ na-agụ gị, nye gị nri, ma ọ bụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, nye gị mmiri?
Oleekwa mgbe anyị hụrụ ka ị bụ onye ọbịa, nabata gị, ma ọ bụ ka ị gba ọtọ, yibe gị akwa? Olee mgbe anyị hụrụ na ị nọ n’ọrịa, ma ọ bụ na mkpọrọ, bịa leta gị?
Onye eze ahụ ga-azakwa ha sị; N’ezie, agwa m ụnụ; mgbe ọbụla ụnụ meere ya ọ bụladị otu onye pekarịchara mpe n’ime ụmụnna m ndị a, mụ onwe m ka ụnụ meere ya.
Mgbe ahụ ọ ga-asị ndị ahụ nọ ya n’aka ekpe: ‘Pụọnụ n’ihu m, ụnụ ndị a bụrụ ọnụ! Gaanụ n’ọkụmmụọ ebeebe nke a kwadooro ekwensu na ndị mmụọozi ya!
N’ihi na mgbe agụụ na-agụ m ụnụ enyeghị m nri, mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ, ụnụ enyeghị m mmiri. Mgbe m bụ onye ọbịa ụnụ anabataghị m, agba m ọtọ ụnụ eyinyeghị m akwa, mgbe m nọ n’ọrịa na n’ụlọmkpọrọ ụnụ abịaghị leta m.
Mgbe ahụ ha ga-aza ya sị: “Onyenweanyị olee mgbe anyị hụrụ na agụụ na-agụ gị, akpịrị na-akpọ gị nkụ, mgbe ị bụ onye ọbịa, ka ị gba ọtọ, nọrọkwa n’ọrịa ma ọ bụ n’ụlọ mkpọrọ wee ghara inyeere gị aka?
Ma ọ ga-aza ha sị: ‘N’ezie agwa m ụnụ, ebe ụnụ emereghị ya ọ bụladị otu onye dịkarịchara nta n’ime ndị a, ụnụ emereghị m ya. Ha ga-apụ wee banye n’ahụhụ dị ebeebe, ma ndị eziomume ga-abanye na ndụ ebeebe.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu