Mọnde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
James: 1:1-11
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 119: 67, 68, 71, 72, 75, 76
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMak: 8:11-13
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – James: 1:1-11
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Jemis
Jemis, nwodibo Chineke na nke Onyenweanyị Jesu Kristi, na-edegaarra agbụrụ iri na abụọ ndị gbasara n’elu ụwa niile akwụkwọozi: Ndewonụ! Ụmụnna m! Gụọnụ onwe ụnụ na ndị iheọma meere, mgbe ọbụla a na-anwa ụnụ mọbụ mgbe ụnụ zutere ọnwụnwa n’ụzọ dị icheiche.
N’ihina, dịka ụnụ maara, nnwale a na-anwale okwukwe ụnụ na-eme ka ụnụ kwụdosie ike. Ka nkwụdosike ụnụ merie ọnwụnwa niile, ka ụnụ zuo oke ma nwezuo ihe niile, na-adịghị ihe ọbụla nke dị mkpa kọrọ n’ime ụnụ.
Ọ bụrụ na o nwere onye ọbụla n’ime ụnụ nke na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, “onye na-enye mmadụ niile n’efu, n’ebughị ụzọ taa mmadụ ụta. Ọ ga-enyekwa onye ahụ amamihe! Mgbe ị na-arịọ ya arịrịọ dị otu a, jide okwukwe.
Enwela obi abụọ. Onye nwere obi abụọ n’ekpere yiri ebili mmiri oke osimiri, nke ifufe na-ebugharị na atụli elu. Onye dị otu a echekwala na ya ga-arịọta ihe dị ya mkpa n’aka Onyenweanyị.
N’ihina mmadụ dị otu a bụ onye ihu abụọ, onye na adịghị eguzo n’otu ebe n’ihi ọbụla ọ na-eme. Ka nwanna ọbụla bụ ogbenye ñụrịa ọñụ mgbe ọbụla Chineke weliri ya elu.
Ka nwanna ọbụla bụ ọgaranya ñụrịkwa ọñụ mgbe ọbụla e wedara ọnọdụ ya n’ihina, dị ka okooko ọcha, ọgaranya ga-ewuchaa gafee.
Anyanwụ na-awalite, ya na ọkụ ya na-eresi ike, kpọnwụọ ahịhịa; Okooko ọcha ya adaa, ịmamma ya alaa n’iyi. Otu a ka ọgaranya ga-esi daa mgbe ọnọ na-achụso akụnụụba.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 119: 67, 68, 71, 72, 75, 76
Azịza: Onyenweanyị, Ka ebere gị bịakwute m ka m wee dị ndụ.
1. Ejehiere m ụzọ tupu i nye m ọpịpịa
mana ugbu a ana m edobe iwu gị.
Azịza: Onyenweanyị, Ka ebere gị bịakwute m ka m wee dị ndụ.
2. Ị dị mma na-emekwa ihe dị mma,
kuziere m iso ụzọ gị.
Azịza: Onyenweanyị, Ka ebere gị bịakwute m ka m wee dị ndụ.
3. Ọ dị mma na atara m ahụhụ,
Ka m wee nwee ike ịmata ụzọ gị.
Azịza: Onyenweanyị, Ka ebere gị bịakwute m ka m wee dị ndụ.
4. Iwu siri n’ọnụ gị pụta ka mma,
karịa puku kwuru puku ọlaọcha na ọlaedo.
Azịza: Onyenweanyị, Ka ebere gị bịakwute m ka m wee dị ndụ.
5. Amaara m na ikpe gị kwụ ọtọ O Onyenweanyị,
na ị tara m ahụhụ n’ihi ịkwụdosiike gị.
Azịza: Onyenweanyị, Ka ebere gị bịakwute m ka m wee dị ndụ.
6. Ka ịhụnaanya gị kwụdosiri ike dị njikere ịtasị m obi
dịka nkwa i kwere nwodibo gị siri dị.
Azịza: Onyenweanyị, Ka ebere gị bịakwute m ka m wee dị ndụ.
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
Mụ onwe m bụ ụzọ, eziokwu na ndụ, Onyenweanyị na-ekwu. Ọ dịghị onye ọbụla ga-abịakwute Nna ma ọ bụghị site na m.
Alleluia.
OZIỌMA – Mak: 8:11-13
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere Jesu bido nrụrịtaụka, na-achọkwa ihe ịrịbaama si n’igwe bịa iji nwalee ya. Ọ mara ọsụ ruru na mmụọ, jụkwaa sị, “Gịnị mere ọgbọ a ji achọ ihe ịrịbaama?
N’ezie agwa m ụnụ, agaghị enye ọgbọ a ihe ịrịbaama ọbụla. Ọ hapụrụ ha, banyekwa ọzọ n’ụgbọmmiri, gafee n’ofe nke ọzọ
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu