Fraịde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
1Kings: 11:29-32; 12:19
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 81:9-10,11-12,13-14
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMak: 7:31-37
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1Kings: 11:29-32; 12:19
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Ndịeze nke mbụ
Otu ụbọchị, ka Jeroboam si na Jerusalem na-aga njem, onye amụma Ahija nke Shilo zutere ya n’ụzọ. Ha abụọ sọọsọ nọ n’ịkpa.
Ahija yi uwe ọhụrụ. Ahija ejide uwe ọhụrụ a o yi dọkasịa ya ụzọ iri na abụọ, wee gwa Jeroboam sị, “Were iri n’ime ha n’ihina Yahweh Chineke nke Izrel kwuru sị, Lee aga m anapụta Solomọn alaeze ya, were agbụrụ iri n’ime ha nye gị, ị ga-ejide otu agbụrụ, maka ihi nwodibo m bụ Devid ya na maka ihi Jerusalem, nkee bụ obodo m họọrọ n’ime agbụrụ niile dị n’Izrel. Site ụbọchị ahụ ruo taa ụmụ Izrel nọ na nnupụisi megide ezinụụlọ Devid.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 81:9-10,11-12,13-14
Azịza: Abụ m Osebụrụwa Chineke ụnụ, geenụ m ntị.
1. Ụnụ enwela chi ọzọ n’etiti ụnụ;
ụnụ esekpurula chi ndị mba ọzọ.
Abụ m Osebụrụwa Chineke ụnụ,
onye dupụtara ụnụ n’ala ljipt.
Azịza: Abụ m Osebụrụwa Chineke ụnụ, geenụ m ntị.
2. Mana ndị nke m egeghị m ntị;
Izrel ekweghị erubere m isi.
Ya mere m jiri hapụ ha n’isiike ha;
ka ha mebe ihe masịrị ha.
Azịza: Abụ m Osebụrụwa Chineke ụnụ, geenụ m ntị.
3. A sị na ndị nke m ga-ege ntị;
a sị na Izrel ga-eso ụzọ m!
N’otu ntabi anya aga m emeri ndịiro ha,
lụso ndị na-ebuso ha agha ọgụ.
Azịza: Abụ m Osebụrụwa Chineke ụnụ, geenụ m ntị.
MBEKU – Jọn 14:5
Alleluia, Alleluia:
Megheere anyị obi, Onye-nwe-anyị, ịge ntị n'okwu Ọkpara gị.
Alleluia.
OZIỌMA –Mak: 7:31-37
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jesu siri n’okeala Taya pụọ, gafee Sidọn, si na mpaghara Dekapolis ruo osimiri Galili. Ha kpọtaara ya otu nwoke ntị chiri nke na-asụkwa oke nsụ.
Ha rịọrọ ya ka o bikwasa ya aka. Jesu siri n’igwe mmadụ ahụ kpọpụ ya iche, tinye mkpịsịaka ya na ntị abụọ nke onye ahụ ntị chiri, bụsa mkpịsịaka ya asụ, detụ ya n’ire onye ogbi ahụ; O wee lelie anya n’eluigwe, sụọ ude, sị nwoke ahụ, “Efeta!” nke pụtara “Meghee”.
Ntị nwoke ahụ meghere; ire ya tọghepụkwa, o kwukwara okwu nke ọma. Jesu nyere ndị nọ ebe ahụ iwu, ka ha ghara ịkọrọ onye ọbụla banyere ọrụ ebube a.
Ma ka ọ na-agwa ha ka ha ghara ikwu, ka ha gara n’ihu na-akọsa ọrụ ya karịa. Ọ tụrụ ha n’anya nke ukwuu, nke mere na ha na-asị, “O meela ihe niile nke ọma. Ọ na-eme ọ bụladị ndị ntị chiri ka ha nụ ihe, na-emekwa ndị ogbi ka ha kwuo okwu
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu