Tọọzde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
2 Sam: 7:18-19, 24-29
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 132: 1-2, 3-5, 11, 12, 13-14.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMak: 4:21-25
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2 Sam: 7:18-19, 24-29
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ abụọ nke Samuel
Eze Devid banyere n’Ụlọikwu nsọ Yahweh nọdụ ala. O wee kpee ekpere sị, “Abụ m onye, Yahweh Chineke? Gịnị ka ezinụụlọ m bụ I ji meere m iheọma niile a? Ma n’anya gị, Yahweh Chineke, nke a abụghị ihe ọbụla, I mere ka nkwa gị ruo n’ọdịniihu n’ebe ụlọ nwodibo gị dị.
I meela ka Izrel bụrụ ndị nke gị ebeebe. Gị onwe gị Yahweh abụrụla Chincke ha. Ugbu a Yahweh Chineke mezuo nkwa i kwere nwodibo gị na ezinụụlọ ya. Mekwaa dịka I kwuru. Aha gị ga-adị ukwu ebeebe. Ndị mmadụ ga na-ekwu sị, Osebụrụwa nke igwe ndịagha bụ Chineke nke Izrel.
Ezinụụlọ nwaodibo gị Devid ga-akwụdosịkwa ike n’ihu gị. Yahweh Chineke nke igwe ndịagha! Gị, Chineke nke Izrel! Enwere m obi siri ike ikpe ekpere nke a n’ihina i kpugheere mụ, bụ odibo gị ihe ndị a niile, wee gwakwa m na ị ga-eme ka ụmụ m bụrụ eze.
Yahweh Chineke, gị onwe gị bụ Chineke! Okwu gị niile bụkwa eziokwu. Ugbu a, i kwela nwodibo gị nkwa ọma nke a. Ya mere, ana m arịọ ka ị gọzie ndị agbụrụ m, ka ha nọgide n’ihu gị ebeebe. Gị onwe gị, Yahweh Chineke ejirila ọnụ gị kwe nkwa nke a. Site na ngọzi gị, ụlọ nwodibo gị ga-abụ ụlọ a gọziri agọzi ebeebe.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 132: 1-2, 3-5, 11, 12, 13-14.
Azịza: Onyenweanyị ga-enye ya alaeze nna ya Devid.
1. O Onyenweanyị, cheta Devid,
na ahụhụ ọ tara
Na iyi nke ọ ñụọrọ Chineke,
Nkwa nke o kwere onye dị ukwuu nke Jekọb.
Azịza: Onyenweanyị ga-enye ya alaeze nna ya Devid.
2. “Agaghị m aba n’ụlọ m,
mọbụ rịgoro n’akwa m.
Agaghị m arahụ ụra ọbụla,
mọbụ mechie anya m,
Wee ruo mgbe m nwetaara Onyenweanyị ọnọdụ,
Ebe obibi nke onye kacha elu nke Jekọb.”
Azịza: Onyenweanyị ga-enye ya alaeze nna ya Devid.
3. Onyenweanyị ñụọrọ Devid iyi,
ọ gaghị echegharị na ya,
“Otu n’ime ụmụ gị
ka m ga-akwụba n’ocheeze gị.
Azịza: Onyenweanyị ga-enye ya alaeze nna ya Devid.
4. Ọ bụrụ na ụmụ gị edobe iwu niile nke m nyere ha,
na atụmaatụ niile m ga-akụziri ha,
ụmụ ha na agbụrụ ha niile
ga-anọkwa n’ocheeze gị ebeebe.
Azịza: Onyenweanyị ga-enye ya alaeze nna ya Devid.
5. N’ihina Onyenweanyị ahọrọla Zayọn,
ọ họrọla ya ka ọ bụrụ ebe obibi ya,
“Ebe a ka m ga-anọ ebeebe,
ebe a bụ ebe obibi m họọrọ.
Azịza: Onyenweanyị ga-enye ya alaeze nna ya Devid.
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
Oriọna dịịrị ụkwụ m ka okwu gị bụ,
ìhè dịịrị okporo ụzọ m.
Alleluia.
OZIỌMA – Mak: 4:21-25
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
Jesu jụrụ igwe mmadụ ahụ sị, “A na-ebute mpanaka ka e jiri efere kpuchie ya mọbụ ka a dọba ya n’okpuru akwa ndina? Ọ bụ ihe a na eme abụghị ịdọkwasị ya n’elu ihe ịdọkwasị ọkụ?
O nweghị ihe e zoro ezo nke na-agaghị apụta ihe; o nweghịkwa ihe e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe. Onye nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ”.
Ọ sịkwara ha, “Kpacharanụ anya n’ihe ụnụ na-anụ, n’ihina otu ụnuụ si meso ndị ọzọ ka a ga-esi meso ụnụ, ma meso ụnụ karịa. Onye ọbụla nwerenụ ka a ga agbakwunyere ọzọ; ma onye na-enweghị ihe o nwere, ọ bụladị ndị o nwere enwe, a ga-anapụ ya ha”.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu