Ncheta nke Ndị-nsọ Timọti na Taịtọs, ndị Bishọp.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
2 Timoti 1:1-8 Timoti Ma ọ bụ Taịtọs 1:1-5
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 96:1-2a, 2b-3, 7-8a, 10
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMak: 3:22-30
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ - 2 Timoti 1:1-8 Timoti
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ abụọ nke
Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n’ọchịchọ Chineke, bú nkwa nke ndu nime Kraist Jisus, nēdegara Timoti akwukwọ, bú nwa nkem: amara na ebere na udo nke sitere n’aka Chineke Nna na Kraist Jisus Onye-nwe-ayi. Ana m ekele Chineke, bú onye m ji akọ na uche dị ọcha na-efe ofufe dika ndi nna nna m mere, dika m na-echeta gị mgbe niile n’ekpere m, abalị na ehihie. Ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ gị ọzọ, na-echeta anya mmiri gị, ka m we jupụta n’ọṅụ; ebe m na-echeta ezi okwukwe gị nke buru ụzọ biri n’ime nne nne gị bú Lọịs na n’ebe nne gị bú Yunaịse nọ, na obi siri m ike na ọ na-adi ndu nime gi. N’ihi nka, a na m echetara gị ka ị kpalite onyinye Chineke nke i nwere site n’itinye aka m n’ime gị. N’ihi na Chineke enyeghachi ayi mọ nke egwu, kama ọ bụ nke ike na ịhụnanya na njide onwe-ya. Ya mere, emela ihere àmà unu nye Onye-nwe-ayi, maọbụ mu onwem bú onye-nkpọrọ n’ihi Ya; ma buru òkè n’ihe isi ike nke oziọma site n’ike nke sitere n’aka Chineke.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
Ma ọ bụ Taịtọs 1:1-5
Pọl, ohu Chineke na Onye-ozi Jizọs Kraịst n’ihi okwukwe nke ndi Chineke họpụtara na nnabata nke eziokwu okpukpe, n’olileanya nke ndu ebighị ebi nke Chineke bú onye na-adighi agha ụgha kwere nkwa tupu oge eruo, bú onye n’ezie n’oge kwesiri ekwesi kpughere okwu Ya n’okwu mkpọsa nke e nyere m n’aka site n’iwu nke Chineke Onye-nzọpụta ayi; Taịtọs, ezi nwa m n’okwukwe ayi nile: amara na udo nke sitere n’aka Chineke Nna na Kraist Jisus Onye-nzọpụta.N’ihi nka ka m rapuru gi na Krit ka i we dozie ihe fọduru ime, guzokwa ndi-nchu-àjà n’obodo ọ bula, dika m nyere gi iwu.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
Abụ Ọma -Ps: 96:1-2a, 2b-3, 7-8a, 10
Aziza. Kwusaara mba nile ọrụ ebube Chineke.
1. Bùkuenu Jehova abụ ọhu;
Bùkuenu Jehova abụ, unu ala nile.
Bùkuenu Jehova abụ; gọzie aha-Ya.
Aziza. Kwusaara mba nile ọrụ ebube Chineke..
2. Kwusaanu nzọpụta Ya kwa ụbọchị.
Gosinu ebube-Ya n’etiti mba nile;
n’etiti ndi nile di iche iche, ọlu-Ya nile.
Aziza. Kwusaara mba nile ọrụ ebube Chineke.
3. Nyenu Jehova, unu ab͕uru nile nke mba nile,
Nyenu Jehova nsọpuru na otuto;
Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya.
Aziza. Kwusaara mba nile ọrụ ebube Chineke.
4. Sinu n’etiti mba nile: Jehova bu eze.
O mewo ka uwa guzosie ike, o bughi ka e megharịa ya anya;
Ọ n’achi ndi nile di iche iche n’ezi omume.
Aziza. Kwusaara mba nile ọrụ ebube Chineke.
Alleluia
Gụọ 2 Timoti 1:10
Alleluia, alleluia.
Onye-nzọpụta anyị Jisọs Kraịst ebibiwo ọnwụ wee weta ndu n’ìhè site n’oziọma.
Alleluia, alleluia.
OZIỌMA – Mak: 3:22-30
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
Ndị odeakwụkwọ si na Jerusalem gbadata na-ekwukwa sị, “Mụọ Belzebul ejidele ya, ọ bụkwa n’ike mmụọ ọjọọ ka o ji achụpụ ndị ajọmmụọ”. N’ihi nke a Jesu kpọrọ ha, tụọrọ ha ilu ndị a sị, “Olee otu ekwensu ga-esi achụpụ ekwensu?”.
Alaeze ọbụla kewara ekewa iji megide onwe ya agaghị eguzo. Ezinụụlọ ọbụla kewara ekewa iji megide onwe ya agaghị eguzokwa. Ọ bụrụkwa na ekwensu ebilie megide onwe ya, ọ gaghị eguzo; kama isi njedebe ya abịala nso.
O nweghị onye nwere ike ịbanye n’ụlọ dike zuo ihe o ji biri, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ kee ya agbụ; mgbe o mere nke a ka ọ ga-enwe ike zuo ihe dị n’ụlọ ya.
N’ezie agwa m ụnụ, a ga-agbaghara ụmụ mmadụ mmehie ha niile na nkwulụ ha ọbụla; ma onye ọbụla kwulụrụ Mmụọ Nso agaghị enweta mgbaghara, kama ọ nọ n’ikpe ọmụma nke njọ, ebeebe”.
O kwuru nke a n’ihina ụfọdụ n’ime ha sịrị, “O nwere mmụọ ọjọọ n’ime ya”.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu